Obiano enyela Igwe Orsumoghu, Ideani, Ugbene asambodo
Ọ NA-ABỤ a nyụọ nsị, a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò, maka na ọ na-adị mma, a kpụchaa Diji, a kpụnye ya óké ji n’aka. N’ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie nọrọ na nsonso a wee nye ndị eze ọdịnala ọhụrụ obodo Orsumoghu, Ideani na Ugbene asambodo, iji gosi na gọọmenti kwàdoro ma nye ha ikike ịbụ eze ọdịnala obodo ha dị iche iche. Mmemme inye asambodo a bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi Gọvanọ dị n’Amawbia, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu n’ime steeti ahụ sonyere na ya. Ya bụ mmemme bụ nke a nọrọ na ya wee nye Igwe Steven Onyekwelu Ezeji asambodo dịka eze ọdịnala obodo Ideani dị n’okpuruọchịchị ime obodo ‘Idemili North’; nye Igwe Samson Chimakwa asambodo dịka eze ọdịnala obodo Ugbene dị n’okpuruọchịchị ime obodo ‘Awka South’; ma nye Igwe Elochukwu Mbanefo asambodo dịka eze ọdịnala obodo Orsumoghu dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ihiala. N’okwu ya oge ọ na-enyefe ha asambodo ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwàrà omenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịben