Anambra ga na-akwàlite ọdịmma ndị ntorobịa – Soludo

Aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Chukwuma Soludo (nke mbụ n'aka ekpe) na ndị ọzọ, oge ọ na-anabata ihe onyinye ụmụakwụkwọ ahụ nyere ya na mmemme ahụ Izunna Okafor dere akụkọ ndị a AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na gọọmenti ya agaghị ada mbà n'ịkwàlitè ọdịmma ndị ntorobịa steeti ahụ, ọkachasị site n'ịkụziri ha ọrụ aka dị icheiche na inye ha nkwàdó ga-eme ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha. Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a na mmemme imerubè ọgbụgba afọ iri abụọ na asaa nke ụlọakwụkwọ 'Holy Child Secondary School' dị n'Isuofia n'okpuruọchịchị ime Aguata nke steeti Anambra, bụ nke wééré ọnọdụ na nsonso a. Ya bụ mmemme bụkwa nke dọtara imirikiti ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ nà mpụ̀ga ya, tinyekwara ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ n'ebe ahụ. N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Soludo nyèrè nkọwa banyere atụmatụ inye ọzụzụ nkụzi ahụ na-aga n'ihu na steeti ahụ ugbua, nke a maara dịka “One youth Two Ski