Nigeria na-atụ anya ọgwụ mgbochi korona ọzọ n’Ọgọstụ – Shuaib
NIGERIA na-ele anya ịnabatakwa ọgwụ mgbochi korona ruru nde asatọ n’ọnwa Ọgọstụ, nke ga-agụnye ndị gọọmenti United States nyere n’efu. Onyeisi National Primary Health Care Development Agency (NPHCDA), Faisal Shuaib kwuru na ọgwụ ahụ nke Nigeria nwetere n’oge gara aga bụ nke chọrọ iru nde anọ gwụrụ n’izuụka gara aga. Ka ọ dị ugbu a, ha ga-amalitekwa ịgba ọgwụ mgbochi korona n’izuụka olemole na-abịa, ma ndị ọhụrụ a na-atụ anya ya bata. Dịka Shuaib siri kwu, Nigeria na-atụ anya ọgwụ mgbochi dị nde 3.924 nke Oxford/AstraZeneca site n’aka ndị na-agbasa ya n’ụwa niile, COVAX na ngwụcha ọnwa Julaị maọbụ mmalite Ọgọstụ; tinyere nke dị nde 3.93 bụ Pfizer/Biotech maọbụ Moderna bụ ndị gọọmenti US nyere n’efu site n’aka COVAX n’ọnwa Ọgọstụ. Shuaib, n’ozi ọ kụpụụrụ ndụ ntaakụkọ n’Abuja kpọkuru ọha na eze ka ha nọgidesie ike n’ịgbaso usoro mgbochi korona dịka ikpuchi imi na ọnụ, tinyere ịnọ mmadụ ote aka iji gbohie nkesa korona, ganye na ọgwụ ndị ahụ a na-atụ anya abata.