Posts

Showing posts with the label Fada Oraemesi

Fada Oraemesi agbaala afọ iri asatọ, mee ncheta afọ iri ise o jiri chie ụkọchukwu

“ANYỊ nọ ebe a ikele Chineke makai ndu mụ bụ odibo ya etosịghị etosi n’ime afọ iri ise dịka ụkọchukwu tinyere ọgbụgba afọ iri asatọ m. Soro m kelee Chineke. Aja maasị dị asọ bụ ekele kachasị ekele a na-enye Chukwu. N’aha bishọp dayọsis Awka, Most Rev Paulinus Ezeokafor, ụkọchukwu parish bụ Fada Emmanuel Ofomata, ndị kansụl parish (P.P.C) na ndị St Gabriel Parish, Okpuno gozie ụnụ.”   Nke a bụ okwu nke Fada Ọkammụta Oraemesi ụbọchị ụka ọnwa Ọktoba dị n’abalị iri atọ na otu n’afọ a bụ 2021 dịka ndị ụlọụka St Gabriel’s parish, Okpuno, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra chịkọbara oke mmemme gbara mkpị (double celebration) n’aha ya.   Fada Oraemesi nabatara mmadụ niile si ugwu na ndịda bịa ọkachasị ndị ọkammụta na ụmụakwụkwọ nke Nnamdị Azikiwe University, Awka (UNIZIK) na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University (COOU), na ndị si parish dị iche iche ọ rụrụ dịka ụkọchukwu. O kpere ka Chineke gọzie ha n’ebe ọ dị ukwuu.   N’okwuchukwu ya, Fada Angelo Obiako toro Fada Oraemesi n

Fada Oraemesi ga-eme ncheta ọgbụgba afọ iri asatọ n’afọ iri ise o chiri ụkọchukwu, ụbọchị ụka

ỤBỌCHỊ ụka ọnwa Oktoba ga-adị n’abalị iri atọ na otu ka a ga-eme emume icheta afọ iri ise (Golden Jubilee) nke Fada Ọkammụta John Chukwuma Oraemesi ji chie ụkọchukwu, tinyere emume afọ iri asatọ ọ nọrọla n’elu ụwa.   Oke mmemme a ga-ewere ọnọdụ n’ụlọụka St Gabriel’s Catholic Church, Okpuno n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra. A ga-eji aja maasị elekere iteghete na ọkara (9:30 am) were malite.   Onye ga-abụ onyeisioche bụ Ọkammụta Fidelis Okafor jibu ọkwa dịka onyeisi ụlọakwụkwọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University (COOU); ebe onyeisioche nke abụọ ga-abụ Ọkammụta Can. Nwankwo nke Nnamdi Azikiwe University, Awka. Onye ga-abụ nna ụbọchị ahụ bụ Ọkammụta Ellis Idimobi bụ osote onyeisi ụlọakwụkwọ COOU. Osote onyeisi kansụl parish St Gabriel, Sir Walter Umeukeji so wee tinye aka n’ozi n’aha ụkọchukwu parish na ndị niile na-aga ụka na St Gabriel’s Parish, Okpuno.