Etoola Pope Francis maka onye Igbo e chiri fada n'ụlọọgwụ na Rome
Onye nwụrụ izuụka olemole e chichara ya fada ỌTỤTỤ ndị mmadụ ekwuputala afọ ojuju ha nwere banyere onye Igbo e chiri ụkọchukwu ka ọ nọ n’ọrịa na Rome. E chiri ya ụkọchukwu ka ọnwa April dị n’abalị nke mbụ. Fada Livinus Esomchi Nnamani gbara afọ iri atọ na otu nọ na-arịa ọrịa ọbara ‘leukemia’ nke mere ka ọ nọrọ n’ọnọdụ so nsogbu ọrịa. Fada Livinus mere mkpebi ma degara Pope Francis edemede, rịọ ya ka e chie ya ụkọchukwu nsonso. Ya mere, ọsịsa ozi ahụ bịara site n’aka Pope Francis ka ọnwa March dị n’abalị iri atọ na otu, ebe ọ nọ nye nkwado ka e chie ya ụkọchukwu ozigbo. N’echi ya, April 1, bishọp enyemaka ‘auxilliary bishop’ nke Rome, Most Rev. Daniela Libanori chiri ya ụkọchukwu. Ọ bụ n’ụlọọgwụ Presidio Sanitario Medica Group Casilino Hospital, Rome, ka a nọ chie ya ụkọchukwu. Ka ọ gachara izuụka olemole e chiri ya ụkọchukwu, Fada Livinus Esomchi Nnamani zara Chukwu kere ya oku. N’ihi nke ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ toro onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis maka ịhụnanya o gosiri F