Fr Obimma ga-eme ncheta afọ iri o chiri ụkọchukwu, ụbọchị ụka
…Tinyekwara ihe ndị ọzọ ỤKỌCHUKWU parish nke Blessed Iwene Tansi Catholic Church, Umudioka, Dunukofia, ma bụrụkwa onyeisi (Spiritual Director) nke Holy Ghost Adoration Ministry, Uke, Nigeria, Fada Emmanuel Obimma (Ebube Muonso) ga-eme nnukwu emume atọ a chịkọrọ ọnụ (3-in-1 celebration) ụbọchị ụka ọnwa Oktoba afọ a bụ 2021 ga-adị n’abalị atọ. Ozi rutere ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), ndị na-ebipụta akwụkwo akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLightXTRA na Homeland kọwara na emume ahụ nke a ga-anọ n’ogige Holy Ghost Adoration Ministry Uke were mee, nke ga-amalite n’aja maasị elekere iri ụtụtụ, bụ ncheta afọ iri o jiri chie ụkọchukwu, ncheta afọ iri e hibere ụlọekpere (ministry) ahụ, tinyere owuwe ihe ubi (2021 harvest thanksgiving). Nnukwu onye ọbia pụrụ iche na mmemme ahụ ga-abụ, aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obiano (Akpokuedike Global); ebe onyeisioche ga-abụ Chiifu Joseph Ezeokafor (Nwachinemelu Ekwulobia, onyeisi Jezco Oil); onye ọbịa p