Ndị mmadụ etoola Chineke dịka Fada Egbeonu mere ncheta afọ iri abụọ na ise o chiri ụkọchukwu
Ọ BỤ emume ọńụ na ịtụrụ Chineke mmamma dịka Fada Longinus Uchenna Egbeonu mere emume icheta iri afọ abụọ na ise o chiri ụkọchukwu (silver jubilee). Ọ bụ na Satọdee ọnwa Ọktoba dị n’abalị iteghete ka a nọ n’ụlọụka St Michael’s Parish Umueze-Uga, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra wee mee oke mmemme ahụ. Fada Egbeonu kelee Chineke onye debere ya ndụ, onye mere ka mmemme ahụ were ọnọdụ n’ozuzu oke. O kwuru sị: “Ekele dịrị Chineke, onye ji ji, jide mma, onye ọ wanyere o rie. Otito niile, mbuli elu na ịja mma bụrụ nke ya n’aha Onywenweanyị Jesu Kristi.” O kelere Bishọp dayọsis Ekwulobia bụ Most Rev Peter Okpaleke tinyere ndị Bishọp niile ọ gafere n’okpuru ha, ndị gụnyere Archbishọp Albert Obiefuna na Bishọp Simon Akafor bụ onye chiri ya ụkọchukwu. Ọ gara n’ihu kelee ndị Fada niile kuziiri ma gbaziere ya, tinyere ndị zụrụ ya na ndị niile nyeere ya aka ịza oku Chineke kpọrọ ya. Mgbe ọ na-ekwu okwuchukwu n’aja maasị dị asọ, Fada John Umeojiakor kọwara Fada Egbeonu dịka