Fada Anulunko etoola Chineke maka afọọma ya
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ na nso nso a n’ụlọ ụka St Martin’s Catholic Church, Igboukwu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata. Ụbọchị ahụ bụ oke ụbọchi na ndụ Very Rev Fada Emmanuel Chukwunalu Anulunko dịka ọ tụụrụ Chineke mmamma maka ịgba afọ iri asaa n’elu ụwa a tinyekwara afọ iri anọ ọ jị buru ụkọchukwu. Nke a bụ nnọọ mmemme ikele Chineke n”eziokwu n’ihi na ụmụ mmadu si n’ugwu na ndịda wee bịa soro Fada Anulunko wee ñurịa. E ji aja maasi elekere iri wee malite ya ebe Fada Anulunko no wee kelee Chineke n’ebe ọ dị ukwuu. O kwuru si na ọ bụ site n’amara Chineke ka ya jị wee dị ndụ ma na-alụkwa ọlụ ya. O kwuru si: “Abụ m Fada Emmanuel Anulunko, nwa Jonas na Susanna Anulunko n’Achalla Umuchu. Ana m ekele Chineke, aja maasi a ka m ji kele ya. Agaghị m ekelekata ya kwusi, ana m ekenekwaa ununwa biara abịa.” Fada Anulunko gakwara n’ihu kenee ndị St Martin’s Igboukwu na ndị Igboukwu nile n’ihi na ọ bụ n’Igboukwu ka o malitere ọlụ mgbe ọ chichara Fada n’afọ 1978, mgbe obodo dị iche iche dị na ‘Our Lady of Fa