Posts

Showing posts with the label FOSSSA

Ekeh amalitela ihe ọmụmụ mkparịtaụka

ONYE odeakwụkwọ izugbe nke Faculty of Social Science Students’Association (FOSSSA), Nwada Ekeh Angel Kosisochukwu na njikọta aka ọfiisiodeakwụkwọ mgbasa ozi Students Union Government (SUG), Nnamdi AzikiweUniversity, Awka akọwapụtala isiokwu a kpọrọ ‘National Development as a Meansof Getting the Future Ready for the Youths’.   Ọgbakọ a dọtara ọtụtụ ndị ọrụ e ji okwu ha agba izu n’ụlọakwụkwọ ahụ dịka Dean ‘Faculty of Social Sciences’, Prof. Rita N. Ugokwe Joseph nke onye nọchiri anya ya bụ onye enyemaka onyeisi, School of General Studies, Dr. Mrs Uju Ezenekwe,  onye bụ onyeisi Unizik Business School, Prof. A. U. Nnonyelu nke onye nọchiri anya ya bụ onye enyemaka onyeisi, Unizik Business School, Dr. Tochukwu Oguegbe, onye ndụmọdụ ndị ọrụ nakwa onyenkụzi ngalaba(Department) Psychology, Dr. N. C. Abamara, HOD Guidance and Counseling, Prof. Ada Anyamene nke onye nọchiri anya ya bụ Dr. Nkechi Ofojebe nakwa ndị  ọzọ.   A kọwara na asọmpi abụ nnọọ nke dị n’etịtị ụmụ akwụkwọ ruru ọnụọgụ iri atọ