Ndị FABDA etòóla Obiano maka ọrụ ịkwàlite mmepụta azụ n'Anambra
NDỊ òtù na-ahụ maka azụ na anụ ndị ọzọ a na-azụ na mmiri, a maara dịka ‘Fishery and Aquaculture Business Development Agency (FABDA), ngalaba steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ọrụ ya ịkwàlite mmepụta azụ na steeti ahụ. Ndịisi nlekọta òtù FABDA kwupụtara nke a oge ha gara njem nleta n’ebe ahụ Gọvanọ Obianọ na-arụ ogige ebe a na-azụpụta azụ na mpaghara ọgbọ nta nkwado sineetị atọ dị na steeti ahụ, iji mara etu ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ. N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ oge ha bagidere na njem nleta ọrụ ahụ, otu onye n’ime ndị òtù nlekọta FADBA ahụ, ma bụrụkwa Kọmishọna na-ahụ maka njem okporoụzọ na steeti Anambra, bụ Maazị Afam Mbanefo, mèrè ka a mara na ogige mmepụta azụ ahụ ga-abụ nnọọ otu n’ime ọtụtụ nnukwu ihe dara ụda ọchịchị Gọvanọ Obianọ mepụtara ma ọ bụrụ na a rụchaa ha, ma bụrụkwa otu n’ime ihe a ga-eji na-echeta ọchịchị ya ma ọ rịtuchagodi n’ọkwa. O kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ha dịka ndị nlekọta òtù ahụ, ịhụ na a rụchapụrụ ọrụ ah