Posts

Showing posts with the label Eziagulu-Otu Aguleri

Igwe Eziagulu-Otu Aguleri agbaala Ọvala mbụ ya

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma kwòó èkwòó n’obodo Eziagụlụ-Otu Agụleri, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’ nke steeti Anambra, dịka eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Lawrence Nwofia mere mmemme ịgba Ọvala mbụ ya, dịka eze ọdịnala obodo ahụ.   Ya bụ mmemme bụkwa nke ndị obodo ahụ nọrọ na ya wee gbaara eze ọdịnala ha lara mmụọ, bụ Igwe Titus Nwatah, Ọvala ikpeazụ, ma bụrụkwa óké mmemme dọtara ndị e ji okwu ha agba izu na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria.   Ụfọdụ obodo ahụ, ndị ichie, ndị Ojianị na eze ọdịnala ahụ, bụ Igwe Nwofia siri n’obi ya wee tiri egwu okanga igba eze wee gaa be Igwe Nwatah lagoro mmụọ, iji kwanyere ya ùgwù ikpeazụ ma sị ya gàá ije ya nke ọma.   N’okwu ya oge ọ na-awa ọjị na mmemme ahụ, Igwe Lawrence Nwofia, ónyé kọwara mmemme ahụ dịka omenala ha na-eme na mgbe na mgbe iji chee obodo ahụ n’ihu Chineke, kèlère Chineke maka ndụ na ahụike nke o jiri gọzie obodo ahụ na ụmụafọ ya, ma ndị nọ n’obodo ahụ ma ndị nọ ebe dị iche iche were agbara onwe ha mbọ.   Dịka ọ na-agọ