Ọǹụ dara ka ezinaụlọ Ọkammụta Igwe kupụtara nwa nwoke n'ụlọụka
…Ka ọ gachara afọ iri na isii ha mụrụ nwa izizi Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma bụrụ ihe oke ọǹụ n’ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church, G.R.A, Awka ka Ọkammụta Ernest Igwe na Oriakụ ya bụ Oby kutere nwa nwoke ọhụrụ Chineke ji gozie ha ka ọ gachara afọ iri na isii ha mụchara nwa izizi. N’aja maasị ahụ nke a nọ na ya nabata nwata ahụ ma mekwaa ya mmiri Chukwu, ụkọchukwu parish ahụ bụ Fada Francis Oranye na ụkọchukwu ọzọ bịara abịa, Fada Ralph Agbanu kelere Chineke maka ụmụaka niile e kụbatara n’ụlọụka ụbọchụ ahụ. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, Fada Agbanu, onye nke sitere St Martin Parish Ifitedunu kwuru na Ọkammụta Igwe bụ onye ya matara mgbe ya nọ na obodo ya dịka ụkọchukwu parish St Paul’s Catholic Church, Achalla Umuchu, site n’afọ 2012 ruo 2018 (afọ isii). O kwuru sị: “Anyị ekpeela ekpere ọtụtụ ma Chineke mechara za anyị ekpere n’ikpeazụ n’ụzọ dị egwu. Anyị nọ ebe a ikele Chineke.” Fada Agbanu gara n’ihu dụọ di na nwunye ndị na-achọ nwa ọdụ ka ha chekwube Chineke oge niile maka na ọ pụrụ