Enugwu-Agụleri emeela Olili Ọbịbịa Eri
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Enugwu-Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’ nke steeti Anambra merùbèrè mmemme Oriri Ọbịbịa Eri, bụ otu nnukwu mmemme ọdịnala pụrụ ichè e jiri mara obodo ahụ. Ya bụ mmemme bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ha sitèrè na ya na-akwanyere nnukwu nna mụsàrà ha ùgwù, bụ Eri, ónyé bụ nwa mbụ nke Gad, otu n’ime ụmụ Jekọb (Jacob) dịka ọ dị n’akwụkwọ nsọ, bụkwa onye e kwenyere na ọ bụ ya mụsàkwàrà Ndị Igbo, n’ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụrụkwa nnukwu nna-nna ha. Nnukwu mmemme ahụ wèèrè ọnọdụ n’obí eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Eze Chukwuemeka Eri, bụkwa onye nọ n’isi mmemme ahụ. Ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti Anambra na mpụga ya sonyèkwàrà na mmemme ahụ. A màlitère ya bụ mmemme site n’ịbagide ịga njem nleta nke eze ọdịnala obodo ahụ gara n’ebe a na-akpọ Agbanabọ Ezu na mmiri Ọmambala n’ihe dịka elekere ise nke ọnụ ụtụtụ, bụ ebe nnukwu nna-nna ha ahụ bụ Eri kwụ