Posts

Showing posts with the label Enugu state

Anambra na Enugu ezutela maka ikpezi nsogbu ókè àlà ha

N’IHI nsogbu ahụ na-adapụta oge ụfọdụ n’etiti steeti Anmbra na steeti Enugu bànyere ókè àlà, steeti abụọ ahụ ezutela ọzọ iji wee kpezie ma wetakwa ya bụ esemokwu n’isi njedobe. Nzukọ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti steeti Enugu, dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti abụọ ahụ, tinyere osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke na osote aka na-achị steeti Enugu bụ Ọkaiwu Cecilia Ezeilo, bụkwa ndị isi oche nke otu na-ahụ maka ihe gbasaara ókè àlà na steeti abụọ ahụ n’otu n’otu. N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, osote aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara na òtù ahụ ná-ahụ maka ihe gbasaara ókè ala n’ala anyị, bụ ‘National Boundary Commission’ anaghị àkpá oke àlà iji wee bute ọgba aghara, kama na ọ bụ iji kwàlite mmepe na udo tọrọ àtọ n’etiti obodo na ibè ya. Ọ gara n’ihu kọwaa oke mkpà nzukọ ahụ dị n’ihi nsogbu dị iche iche ịzọ ókè ala ahụ wètagòrò, ma gosipụta ezi olile anya o nwere na mkparịta ụbụbọ ahụ ga-eweta ùdó tọrọ àtọ nyere ọnọdụ ahụ.

Anambra, Enugu akpọọla oku maka udo n’ihe gbasara oke ala n’ese okwu

N’IHI oke nsogbu ahụ na-adapụtasị site n’ịzọ oke ala dị n’etiti steeti Anambra na Enugu; ọchịchị steeti abụọ ahụ akpọọla oku ka a gbaso usoro udo iji weta ya bụ ajọ ọnọdụ ahụ n’isi njedobe.   Osote aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịnta Nkem Okeke mere ka a mara nke a n’aha steeti abụọ ahụ, ma kpọkuokwa ndị ahụ na-ebute ya bụ ajọ ọnọdụ ka ha sepu aka na nke ahụ ma mịnye mma ha n’ọbọ.   Dọkịnta Okeke, bụ onyeisi oche kọmitii na-ahụ maka oke ala na steeti ahụ kpọrọ oku a ka ha nwechaara nzukọ, ha na ndị e ji okwu ha agba izu n’obodo abụọ ahụ okwu ahụ metụtara, bụ Awba Ofemmil nke steeti Anambra na Ibite-Olo nke steeti Enugu. O mere ka a mara na a tụpụtala atụmatụ  iji mee ka ụdị nsogbu ahụ gharazie ịdapụta ọzọ n’ọdịnihu.   N’ihe gbasaara akụnụba ndị mmadụ e kwuru na e bibiri nakwa ndị mmadụ a tọọrọ atọrọ na mpaghara ebe ahụ n’ihi nsogbu ahụ, Dọkịnta Okeke kwere nkwa na site na njikọ aka ọnụ nke ha na ndị ụlọ ọrụ uwe ojii sitere steeti abụọ ahụ, na a ga-eme nnyocha pụrụ ihe banyere nke ahụ