Ndị na-achị ehi awakpola ụfọdụ obodo n'Enugu, gbuo mmadụ 22
MKPU akwa dara na nsonso a na steeti Ebonyi na Enugu, dịka ndị Fulani na-achị ehi wakpòkwàrà steeti abụọ ahụ ọzọ, ma gbuo mmadụ ruru iri abụọ na abụọ n’ọnụgụgụ. Dịka akụkọ siri kọọ, ọ bụ n’ụbọchị Mọnde ka ndị Fulani ahụ na-achị ehi wakpòrò obodo Obeagụ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ishielu, nke steeti Ebonyi, ma gbuo mmadụ iri na isi n’ebe ahụ, bụ ndị nọ n’agbata ahọ iri na asatọ na ahọ iri ise na isii. Ọgbatumtum iri na ụgbọala nke ndị ahụ e gburu egbu ka e kwuru na ndị Fulani ahụ mụnyekwara ha ọkụ, ha wee gbarikọọ, ghọrọ ntụ. N’okwu ya banyere mwakpo ahụ na ogbugbu e gburu ndị ahụ, otu onye n’ime ndị ahụ ndị Fulani gara eso gbuo ụbọchị ahụ, mana Chineke zọpụtara ya, bụ Oriakụ Ngozi Odoabuchi kọwara ya bụ atụmatụ ndị Fulani ahụ dịka nke na-eyi égwù na nke jọgburu onwe ya. Dịka o siri kọwaa, ya na otu nwaanyị nọ n’Ọkada oge o si n’ụlọọrụ ya na-ala be ya, ha wee hụ mmadụ asaa yi ákwà ojii, nke anọ n’ime ha nọ n’okporoụzọ, ebe atọ ndị ọzọ na-abaye n’ime ọhịa. Oge ha rutere ebe