Emume Isita, oge nnukwu mmemme n’ụka
OGE Isita nke a nọ n’elu ya ugbu a na-abụ oge mmemme dị iche iche. Ndị mmadụ na-esite n’ugwu na ndịda na-aga mmemme n’ebe dị iche iche n’ihi na agha a kara aka anaghị eri ngwụrọ. Ụbọchị ụka gara aga ka ndị otu Kraịst n’ụwa niile mere emume Isita, nke bụ oge e ji echeta mbilite n’ọnwụ ya. Kemgbe ahụ ka a malitere mmemme n’ike n’ike. Ọ bụ eziokwu na a dị mbụ eme mmemme ma nke oge a na-adị egwu. Mmemme a na-eme n’oge a gụnyere ịgba nkwụ nwaanyị, agbamakwụkwọ, ịgba ọfala, ịchi ọzọ, ịkpọghe ụlọ; tinyere na n’oge ugbu a ụfọdụ na-ejikwa oge a eme emume akwamozu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’agbanyeghị ihe isi ike cheere ala anyị aka mgba ugbu a, ndị mmadụ na-aga n’ihu na mmemme ndị ha nwere. Onye ọbụla na-eme ole o nwere ike maka na Igbo kwuru okwu sị na ọ bụ ole aka ha nwaanyị ka ọ na-atụkwasa di ya. N’agbanyeghị na oge a bụ oge mmemme ọ bụkwazi oge oriri na ọńụńụ, na oge e ji egosipụta ịhụnanya site na mmadụ ileta onye ọ ka mma. Ụfọdụ na-ebunye ihe oriri, akwa, ego w.d.g. Otu nwaanyị kw