Posts

Showing posts with the label El-Rufai

CAN akpọkuola gọọmenti Kaduna ka ọ kwụsị ọbara a na-akwafu ebe ahụ

OTU Christian Association of Nigeria (CAN) adọọla gọvanọsteeti Kaduna bụ Nasir El-Rufai aka na ntị ka ọ kwụsị ikwu okwu na-ebute iwegbasara nghafu ọbara nke a na-aghafu na mpaghara steeti ya bụ Southern Kaduna.   Ndị otu ahụkwuputara nke a oge ha gara njem na nke gọvanọ ahụ na Monde, dịka ozi nke sin’aka onyeisi CAN bụ Rev Samson Ayokule sị kọwa.  El-Rufai adịla na mbụkwuo na ụfọdụ ndị ndu na Southern Kaduna nọ n’isi mkpamkpa ahụ na-akpa nampaghara ahụ n’ihi na ha chọrọ ego, ‘brown envelopes’.   Narị kwuru narị mmadụatụfuola ndụ ha n’ebe ahụ, ebe a na-akọ ugbo tinyere ọtụtụ ihe e ji enyere ndụaka lara n’iyi n’ihi oke mwakpo ndị ọ lụọ ọ laa.   N’ozi ndị CAN nkeisiokwu ya bụ ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na steeti Kaduna na mkpa ọ dị ịkwụsịya, nke e nyere gọvanọ ahụ ma zigakwara ya ndị ntaakụkọ, ndị otu ụka ahụkwuputara njikere ha dị ka ha na gọọmenti steeti jikọọ aka ọnụ iji hụ na a kwụsịrịọnọdụ ọjọọ ahụ.   Ozi ahụ sị otu a dị:“Saa, oge ọbụla CAN steeti na nke ala anyị kwara akwa banyere