Korona: E kesàárala ndị ihe na-esiri ike ego karịri otu nde naịra n'Ekwulọbịa
NDỊ mmadụ ihe na-esiri ike ruru narị atọ na iri ise n’ọnụọgụgụeritela uru ma keta òkè n’ego nkwàdo dị otu nde naịra na narị puku naịra asaa,bụ nke e kesàrà n’Ekwulọbịa dị n’okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra, n’ihiọrịa nje korona. Ego ahụ bụ nke ewètara site n’aka òtù a maara dịka ‘Ekwulobia Urban League, United Kingdom,(EULUK)’ bụ òtù jikọtara ụmụafọ obodo Ekwulọbịa bi na mba UK, iji nyere ndịobodo ahụ bụ ụmụnne ha aka, ma bụrụkwa nke e mere site na njikọ aka ụfọdụ ndị ọzọbụ ndị obodo ahụ ọnọdụ ụmụ mmadụ na-emetụ n’obi. N’okwu ya oge ọna-enyefè ego ahụ n’aka òtù ọrụ na-ahụ maka ihe e ji akwalite obibi ndụ n’obodoahụ, Eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Emmanuel Onyeneke kèlere ndị dị iche ichesoro kwàdo ọrụ obi ebere ahụ maka icheta ụmụnne ha n’oge ihe isi ike a, ma kpọkukwaziendị ọzọ ka ha bụ ndị aka ji akụ ka ha ñòmie ezi akparamagwa dị etu ahụ. Ndị dị iche ichesoro keta òkè n’ego ahụ gụnyere ndị di ha maọbụ nwunye ha nwụrụ, ndị agadi, ndịamụtaghị nwa, ụmụaka enweghị nne na nn