Ekele n'ala Igbo, oge mbụ na oge ugbua
NDỊ Igbo sị na ọ na-abụ e kwe ekele, ihu asaa, ma sịkwa naekele e kweghị ekwe dapụụrụ mmụọ onye kelere ya. Onye chọrọ ịma ga-ajụzị, sị ‘Ọ bụ gịnị bụ ekele?’ Ekele bụ bụ ime óbìe gosipụtàrà n’elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche óbì e mepụtàrà n’omume. Nke a pụtarana ekele bụ ụzọ mmadụ si ekwupụta maọbụ egosipụta ka obi dị ya nyegara mmadụibe ya, mmụọ maọbụ Chi kere ya. Ọ bụ ime obi e gosipụtara n’elu ọnụ, ma bụrụkwaechiche e mepụtara n’omume. Ekele pụtara ọtụtụihe n’ebe ọtụtụ ndị nọ n’ihi na ọ bụ ezie na uche bụ uche, mana nghọta dị icheiche. Ndị ọbụla nwèrè ụzọ dị iche iche ha si ekele ekele maka na nkụ dị na mbana-eghere mba nri. Ọ bụkwa ihe ndị na-aghọta ka ha na-asụ. Ekele ndị ọbụlana-agbakwasịkwa ụkwụ n’asụsụ ha n’ihi na ekele niile nwere ụsà. Onye aghọtaghịkwaihe e kelere ya apụghị ikwe ekele ahụ, maka na mmadụ abụghị oke ngwere na-ekwen’isi nye ihe ọbụla ọ nụrụ; ma nke a gwara ya ma nke a gwaghị ya, maọbụ ma nke ọghọtara ma nke ọ ghọtaghị. Nke a pụtara na ndịIgbo, ndị Hausa, ndị Yo