Posts

Showing posts with the label Eke Awka

COVID-19: N’Eke Awka, ahia emechichaghịị mana omechiri

DỊKA a ka na-aga n’ihu na-etinye n’ọrụ ma na-agbasokwa ntụziakaahụ gọọmenti steeti Anambra nyèrè ka e mechisie ahịa dị iche iche e nwèrè nasteeti ahụ, Ka Ọ Dị Taa garùru ahịa Eke Awka dị n’isi obodo steeti ahụ, ijimara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ. Dịka ihe a hụtára n’ebe ahụ siri dị, ya bụ ahịa kana-ekwókwa èkwò ma bụrụkwa nke ụkwụtụụkwụ mmadụ jupụtàrà na ya, na-agbanyeghịna ndị na-ere ahịa n’ebe ahụ na-erube isi nye ntụziaka gọọmenti, bụ nke kwuruna ọ bụ naanị ahịa ihe nri ka a ga na-azụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-azụ, na-ere, ma na-echikọrịtakwa onwe haahụ n’ebe ahụ, ebe ụfọdụ ndị nwere ọnụ ụlọ ahịa dobèkwàrà mmiri e ji akwọ akanà nchà n’ihu ọdụ ahịa ha dị iche iche. Ka o sila dị, ọ bụ naanị na mpụta ebe e si abanye n’ime ahụka ndị mmadụ na-ere ma na-azụkwa ahịa, n’ihi na e mèrè ime ahịa n’onwe ya mkpọchisi,maka na ọ bụ n’ime ebe ahụ ka a na-erekarị ihe ndị ọzọ dị iche iche na-abụghịihe nri. N’ajụjụ ọnụ a gbàrà ya, onye ndu na onyeisi oche òtù nlekọtaahịa ahụ, bụ Ọzọ Emeka Jude Agụm