Ejiji ụmụnwaanyị n'ala Igbo: Mkpụcha na ukwuakwanaabọ
NDỊ Igbo dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ n’ụwa nwere usoro ha ji eji ejiji. A bịa n’ihe gbasara iyi akwa, ụmụnwoke nwere nke ha, otu ahụ ka ọ dịkwa n’ụmụnwaanyị. Mgbe ndị Igbo siri n’ejiji ndị mgbe gboo pụta, ha malitere yibe akwa dịka ọnọdụ onye siri dị. Site n’ụdị akwa onye yi n’ahụ ka ị ga-eji mata ọnọdụ ọ nọ. Ọmụmaatụ: Ị hụ nwaagbọghọ, ị si n’akwa o yi n’ahụ mata, ị hụkwanụ nwaanyị lụrụ dị, otu aka ahụkwa ka ị ga-esi n’ụdị akwa o yi were chọpụta. Ya mere, ụmụnwaanyị nwere akwa mkpucha (gown), nke a maara dịka akwa ụmụagbọghọ na ukwuakwanaabọ (two wrappers) nke ndị lụrụ di na-ama, ha na-eji elu akwa (blouse) ama ya. Nwa agbọghọ nọ be nna ya na-eyi akwa mkpụcha. Ọ na-eyigide ya tupu ọ lụọ di. Ozugbo ọ lụrụ di, ọ malite maba ukwuakwanaabọ. Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na ọ lụọla dị na-esite n’ejiji ya chọpụta na ọ lụọla dị. Ka ọ na-amalite ịma ukwuakwanaabọ ka ọ na-amalite iji ịchafụ isi na-ekechi isi ya n’ihi na a na-ejikwa ikechi isi achọpụta nwaanyị nọ na di. Mana taa, anaghị ejizi ụdịr