Ejiji ndị ala anyị n'afọ 1960 na nke oge ugbua
N’OGE mbụ, oge Nigeria nweereonwe ha n’afọ 1960, e nwereejiji e jirimara ndị alaanyị. Ị hụonye Igbo ị mara, otu ahụka ọ dịkwan’ebe ndị Hausa na Yoruba naagbụrụ ndị ọzọnọ. Ejiji nwaikorobịa na-adị iche na nke nna mmadụ, tinyekwara nke agbọghọbịa na nne nwaanyị. Site n’akwammadụyin’ahụ wee ruon’ụkwụ, ị ga-ama ebe onye si naihe ọ bụ. Mana taa ihe agbanwoola, ọnọdụ adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, a maghịzi onye bụ onye. Agbụrụ dị iche iche na-ejizi ejiji otu o siri masị ha. N’akụkụ ụmụnwoke, anaghị amazị nna mmadụ n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-eyizi akwa ụmụikorobịa. Ọtụtụ ụmụnwoke na-etezi ihe n’isi, ọtụtụ na-akpa nke ha akpa, ebe ndị ọzọ na-akwụzị iyeri ntị w.d.g. Ụmụnwaanyị, ma agbọghọ ma nne nwaanyị na-eyizi traụza n’eleghị anya n’azụ. Ha na-akwụnye mbọ aka, iku anya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ịma ọgọdọ ukwu abụọ bụ ihe e ji mara ụmụnwaanyị ndị Igbo. N’oge ahụ nwaanyị lụọ di, o bido mawa ukwu akwa abụọ nke bụ na onye ọbụla hụrụ ya ga-ama na ọ lụọla di; ma taa, ekwe akụtaghị onye ala ji. Ajụj