Ejije: Soro m chia
NWUNYE: Nna m ukwu, nke a ị lọtara ọrụ n’oge, ihu gị gbarụchaa otu a. Udo ọdịkwa? Di: Nsogbu dị! Ndị ọrụ anyị niile nwụrụ taa ka anyị nọ n’ofiisi. Sọ m bụ onye ji isi ya pụta. Nwunye: Chi m oo! Gịnị mere? Di: Ihe mbigbọ bidoro, ebe niile nwuru ọkụ. Nwunye: Chai, ekele dịrị Chukwu maka ịzọpụta gị. Olee otu I siri gbapụta? Di: Obi ụtọ m, ọ bụ aka ọrụ Chukwu. Afọ malitere nyebe m nsogbu, m were pụọ gaba n’ụlọnposi. Nwunye: Nna m ukwu, ekele dịrị Chukwu na ị dị ndụ. Ọ gịnị ka anyị gaara eme ma a sị na ị nwụrụ anwụ? Ebere na emere m ezinaụlọ ndị ahụ lara mmụọ. Olee otu ha ga-esi na-ebi ndụ ugbu a? Di: Obi ụtọ m, ọ dị egwu, mana United Nations ekpebiela inye ezinaụlọ ndị ahụ niile lara mmụọ nde dọla iri ($10million dollars) n’otu n’otu. Nwunye: Ị sị gịnị? Nde dọla ole? Chaị!!! Nna m ukwu, I meghị nke ọma o, gịnị mere na ị na-ewezuga onwe gị oge ọbụla Chukwu chọrọ ịgọzị anyị?.