Egwuregwu ndị Uweojii nke afọ 2020 abịala na njedebe n'Awka
IGBO sị na ọ na-abụ a nyụchaa nsị a kapnaghị ya ọnụ ọ dị kaòtòrò, maka na ihe a mara bido na-adị mma ịma emechi. Ọ bụ n’ịgbakwasị ụkwụna nke a ka e jiri were oke mmemme dị dara ụda wee wèta n’isi njedobe, asọmpiegwuregwu ndị uwe ojii ala Nigeria nke ahọ 2020, bụ nke weere ọnọdụ n’imesteeti Anambra. Oke mmemme ahụ, bụnke a chịkọbàra n’ogige Alex Ekwueme dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ dọtàràpuku kwùrú puku mmadụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agbaìzù na ngalaba dị iche iche n’ala Nigeria sonyere na ya, nke gụnyere onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadụ Buharị. N’okwu ya na mmemmeahụ, onyeisi ala, Buharị, nke ọ bụ Minista ntà na-ahụ maka gburugburu, bụ OriakụSharọn Ikeazọr nọchitère anya ya, kọwàpụtarà na obi dị ya ka ọkà e ghunyeren’éjù maka etu ya bụ asọmpi egwuregwu siri wee gaa siriri werere, ma bụrụkwanke a na-atụzị anya na mpụtàrà ya ga-amalite ịchawàpụtà n’uju na mpaghara niilenke ala Nigeria n’oge adịghị anya, ọ kachasị dịka o siri metụta ịkwakite ezi ọnọdụ