Posts

Showing posts with the label Egwu oriri na ọṅụṅụ

Egwu ndị Igbo: Egwu oriri na ọṅụṅụ

NDỊ Igbo so n’agbụrụ na-eme oriri na ọṅụṅụ. N’oge gboo, mgbe elu bụ ala ọsa ọ bụ oge ọkọchị mgbe na-abụrụ ha oge ezumike dịka ha sichara n’ọrụugbo pụta na-ewezi owuwe ihe ubi ka ha ji erikarị oriri na ọṅụṅụ.   Oriri na ọṅụṅụ na-adị n’ụzọ dị iche iche, ụfọdụ bụ nke ọha na-eme n’ebe ha na-enwe ọgbakọ, ebe ụfọdụ bụ nke mmadụ na-emere onwe ya n’ezinaụlọ ya. N’ụzọ ọbụla, emume oriri na ọṅụṅụ dịka aha ya siri dị bụ maka oriri bịambịam n’ọnụ. Ma nwoke ma nwaanyị, okenye na nwata na-enwe ezi nchekwube oge ọbụla e nwere emume oriri na ọṅụṅụ dịka: oriri nwa, emume ọdịnala obodo w.d.g. Ka ha na-eri na-aṅụ, ka ha na-agụ na-ekwe. Ọmụmaatụ egwu oriri na ọṅụṅụ bụ: Oriri Oriri Oriri o -Oriri bịambịam n’ọnụ Oriri Oriri Oriri o – Oriri bịambịam n’ọnụ I wete ji i wete ede -Oriri bịambịam n’ọnụ I wete anụ i wete azụ – Oriri bịambịam n’ọnụ Oriri Oriri Oriri o – Oriri bịambịam. n’ọnụoo o.