Posts

Showing posts with the label Egwu ogene

Egwu ndị Igbo: Egwu ogene

EGWU ogene so n’otu egwu ndị Igbo nwere. E si na ngwa egwu‘ogene’ wee nye ya aha n’ihi na a na-eji ogene akụ ya. Site n’oge gboo, ọ bụ ndịIgbo na-arụpụtakarị ogene. Ọ bụ ndị na-akpụ ụzụ na-akpụ ya n’ihi nọ ọ bụ igweka e ji arụ ya. Ogene so na ngwa egwu dị oke mkpa nke e ji igwe arụ n’ala Igbo.   Ụmụnwoke, ọ kachasị ụmụikorobịana-agbakarị egwu ogene. A na-akụ egwu ogene n’ebe dị iche iche a na-eme mmemmedịka iri ji ọhụrụ, ịgba nkwụ nwaanyị, akwamozu w.d.g.   Ndị egwu ogenena-enwe ọgụ egwu, onye na-abụ ọ na-agụpụta egwu ndị ọzọ a na-ekwe ekwe. Ana-ejikarị egwu ogene eduba ma na-eduputakarị mmadụ na mmemme. Ọ na-eme kaobodo na-ekpo ọkụ.