Egwu ndị Igbo: Egwu nwa
NWA bụ oke ihe n’ala Igbo tinyere ụwa niile gbaa gburugburu. A na-elekọta nwa anya ka ọ ghara inwe nsogbu. Ya mere, a na-ekwu na nwa bụ nwa ọha n’ihi na ọ dịịrị onye ọbụla ilekọta nwa. Egwu a na-agụrụ nwa bụ atụrụ taba n’ihi na nke ọbụla nwere oge ya. Ọmụmaatụ: Egwu e ji agụgụ nwa mgbe ọ na-ebe akwa Nwanne m ghara akwa – dongo Akwa adịghị mma – dongo Ọchị kacha mma – dongo dongori dongori dongo