Egwu ndị Igbo: Egwu ndọrọndọrọ
NDỌRỌNDỌRỌ bụ mmadụ na ibe ya maọbụ otu na otu ịzọ ike ka ike, ọmụmaatụ: ndọrọndọrọ ọchịchị. Mgbe ọbụla e nwere ndọrọndọrọ, ndị ọbụla na-enwe ndị nkwado. Oke na ọrụ ha bụ igosipụta na ha ka ibe ha mma. Ndọrọndọrọ abụghị agha kama ọ bụ ọnọdụ e ji egosi ike ka ike site n’ime ka ọha na eze kwenye ma sonyere ha. Ha na-eme nke a site n’ụzọ dị iche iche dịka okwu ire ụtọ, onyinye ihe dịka ego, osikapa w.d.g. Ọ bụ site n’ịhụ na ndị mmadụ kwere ma sonyere ha ka e ji ewebata egwu na ya. N’oge dị otu ahụ, egwu na-adị ụzọ abụọ. E nwere egwu otito nwee nke nkọchị. Ndị ọbụla na-eji egwu otito eto onwe ha ebe ndị ha na ha na-azọ na-eji egwu nkọcha akọcha ha. Ya mere, ha na-esite n’ịgụ egwu gbaa agwa ọma maọbụ agwa ọjọọ n’anwụ. Egwu ndọrọndọrọ na-atọ ụtọ. A na-agụcha ya na redio ma na tiivii. Ọ bụ egwu e ji obi aṅụrị agụ n’ihi na dịka aha ya siri dị, ndọrọndọrọ ka ọ bụ, ọ bụghị agha. Ọmụmaatụ egwu ndọrọndọrọ nke otito: Ugwu k’ayị ga-eso o Ma ọ na-eje eje ma ọ na-ala ala Ugwu k’ayị ga-eso oo Eg