Posts

Showing posts with the label Egwu ndị Igbo

Egwu ndị Igbo: Egwu ọrụ

EGWU ọrụ bụ egwu ndị Igbo na-agụ mgbe ha na-arụ ọrụ. Ndị Igbu bụ agbụrụ na-arụ orụ. Ọrụ ha na-arụ gụnyere: ọrụugbo, ọrụaka, ọrụiro w.d.g.   Mgbe ọbụla ndị Igbo nọ n’ọrụ ha na-eji egwu were aja onwe ha ike. Egwu na-eme ka ha jiri otu obi na-aru ọrụ n’ike n’ike.   Mgbe ụfọdụ ha na-eji egwu ahụ na-eto maọbụ na-akọcha agwa ọjọọ. Ha na-ejikwa ya na-ekwuputa ihe na-eme n’okirikiri ebe ha nọ. Ọmụmaatụ: Mgbe Micheal Okpara dịka onye ọchịchị metara ndị ọrụ (labourers)  mma site n’itinyere ha ego n’ọrụ, ha malitere were ego ahụ na-agụ egwu ma ha na-arụ ọrụ. Lee ya: Lebụra tọrọ tọrọ    …..   e dee (a day) Ndịisi  naịnaị        …….. Lebụra  toro torọ …….. Ndịisi  naịnaị

Egwu ndị Igbo: Egwu ụmụaka

 EGWU ụmụaka bụ egwu sọọsọ ụmụaka na-agba n’ala Igbo. Ụmụaka na-agba egwu n’oge dị iche iche. Mgbe ụfọdụ ha na-amalite n’egwu ọnwa na-amụ ma na-agba egwu tupu ha ebuputa ya. Mgbe ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-agba egwu iche iche ma na-agbakọta ọnụ mgbe ụfọdụ.     Ha na-anọkwazị n’ụlọ mmadụ amụ egwu. Ha mụtachaa, ha ebuputa ya ka ọha obodo hụrụ.   Ụmụaka na-ebuputakarị egwu n’emume iri ji ọhụrụ site n’ịgba ya ebe obodo na-eme emume iri ji. Mgbe ọzọ ha ji ebuputakwa egwu bụ n’emume ekeresimesi. N’ebe ụfọdụ ha na-ebu ya aga n’ụlọ n’ụlọ si ụzọ dị otu ahụ na-adata ego. Egwu na-ewete ịdịnotu na ezi mmekọrịta n’etiti ụmụaka ma na-akwalitekwa omenala.

Egwu ndị Igbo : Egwu nkwa nkwa

EGWU nkwa nkwa bụ egwu ndị Igbo nke e ji osisi achara (bamboo tree) akụ. A na-akpọ ya nkwa nkwa n’ihi otu ụda ya si ada ma a na-akụ ya.   Ọ bụ ụmụnwaanyị na-akụkarị egwu nkwa nkwa. O so n’egwu Igbo dịbara gboo, n’oge ahụ ụmụnwaanyị ndị ọgọ mmụọ na-akụ ya ma ha na-eme mmemme. Nke a mere ka ụfọdụ ndị mmadụ chee na ọ bụ egwu ndị ọgọ mmụọ, ma ọ bụghị otu ahụ. E ji egwu nkwa nkwa eto Chineke n’ihi na ọ bụ ya kere osisi achara.Ya mere, ndị ụka na-akụ nkwa nkwa.   Usoro e si akụ ya bụ na ọkwa nka na-apịchapụta osisi achara, mee ya ọ bụrụ ngwa egwu. Ha na-eji ya aka abụọ, wee na-akụ ya. Ụda ya na-adapụta nke ọma ma na-atọ ụtọ. Ha na-akụ ha a na-agụ, na-agba.   Ụmụnwaanyị Ụka Orie Umugama Umuchu,  bụ ndị otu Catholic Women Organization na-akụ nkwa nkwa ruo taa.   E nweghị egwu pụrụ iche a na-agụ ma a na-akụ nkwa nkwa, ọ bụ egwu ọ bụla masịrị ha ka ha na-agụ. Njiri mara ya bụ ụda ya. Ọmụmaatụ: Kwaị kwaị kwaị …kwakwai kwai Kwaị kwaị kwaị…kwakwaị kwaị

Egwu ndị Igbo: Egwu e ji eze mmiri

DỊKA a na-akụ ka ekwe oge niile, ndị Igbo bụ agbụrụ ji ihe ọbụla na-eme na ndụ ha agụ egwu.Ya mere, mgbe ọbụla mmiri na-ezo, onye ọbụla na-agba ọsọ mmiri site n’ịgbaba n’ụlọ maọbụ n’akụkụ ụlọ ebe ọ ga-anọ zere mmiri. N’ọnọdụ dị otu ahụ, ndị Igbo na-agụ egwu were na-eche ka mmiri bie maọbụ gbachaa. Ma mgbe ha nọ n’ọrụ ma mgbe ha nọ n’ụlọ,ndị Igbo na-eji ịgụ egwu were eze mmiri,ọ bụladị ụmụakwụkwọ nọ n’ụlọakwụkwọ mgbe mmiri na-ezo.   Egwu e ji eze mmiri na-atọ ụtọ nke ukwu ọ kachasị mgbe a nọ n’usekwu na-ahụ ọka na-eru ube, oriri a na-aga. N’oge dị otu ahụ, ọ na-adị ka mmiri hapụ izocha ezocha maka na ọnọdụ dị otu ahụ na-enye obi ụtọ. Ọmmụatụ egwu e ji eze mmiri bụ: Mmiri ……..zobee zobee Anwụ ………mụbaa mụjie chi Agaghị m aba n’ụlọ onye kpọrọ m asị.

Egwu ndị Igbo: Egwu agha

EGWU agha bụ egwu ndị Igbo na-agụ ma ha na-eje agha. Ndị Igbo bụ agbụrụ gbasiri ike, ya mere ọ bụrụ na agha daa ha na-ejikere, kpaa ike dị egwu.   Ụmụnwaanyị anaghị aga agha.Ọ bụ ụmụnwoke na-aga agha.Ọrụ ụmụnwaanyị bụ ịnọ n’ụlọ na-esi nri maka ndị gara agha.   Oge ọbụla ndị Igbo malitere ịga agha, ha na-akwakọrọ ngwa agha dịka egbe, mma, ube, ụta w.d.g.   Ka ha na-aga, ka ha na-agụ egwu dịka: Nzogbu nzogbu  –   Enyimba enyi Nzogbu – Enyimba enyi Nzogbu nzogbu –   Enyimba enyi

Egwu ndị Igbo: Egwu e ji edula, na-anabata nwaanyị be di ya

Ọ BỤRỤ na a gbachaa nkwụ nwaanyị, ụmụ qgbọghọ ga-eji obi aṅụrị gụrụ egwu wee dulaa ya na be di ya. Ọmụmaatụ bụ: Ọ laa …. Ọ laa be ya Ọ laa……Ọ laa be ya Nkechi alaa….. Ọ laa be ya Ọ laa ….. Ọ laa be ya. Mgbe ha batara na be di ya, nne di ya na ndị nwunyedi ya ga-ejikwa egwu nke ha wee nabata ya. Ọmụmaatụ: Chịnye ya kii chịnye ya kii na ọ lọta go Kpọgheere ya ụzọ kpọgheere ya ụzọ na ọ lọta go.

Egwu e ji eduputa nwaagbọghọ n'ịgba nkwụ ya

NDỊ Igbo nwere egwu ha na-agụ n’emume dị iche iche. Emume ndị ahụ gụnyere nkwụ nwaanyị, iri ji ọhụrụ, ịgba ọfala, ọṅụ nwa wdg.   Ya mere, mgbe ọbụla a na-agba nkwụ nwaanyị, a na-eji egwu emerube ya. Emume nkwụ nwaanyị bụ emume ọṅụ, ndị mmadụ na-eji aṅụrị wee na-esonye na ya. Oge ruo mgbe a ga-edupụta nwaagbọghọ na-alụ di, ụmụagbọghọ ibe ya na-eji egwu duputa ya n’ọgbọ. Ha na-agụ, ha a na-agba.   Onye ha na-eduputa n’ọgbọ emere ngala na-apụta. Ha na-agagharị n’ọgbọ, a na-ekiri nwaagbọghọ na-alụ di. Ọmụmaatụ: Ojiugo nwanne m   Eee e Ojiugo nwanne m               Eee e Bịa pụta n’ọgbọ e     Di gị na-eche gị o Ndị ọgọ abịala e       Di gị na-eche gị o

Egwu ndị Igbo: Egwu ifo

EGWU Ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu a na-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo.   Dịka anyị maara, akụkọ ifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha omenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọ banyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere aka wee na-aga.   A na-akọkarị akụkọ ifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike.   Ọtụtụ akụkọ ifo na-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ a na-ekwe. Ọmụmaatụ egwu ifo: Mbe agaba………Ajambene Mbe agaba……….Ajambene Gaagaagaagaa     Ajambene   Otu o sila dị, o nwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. O ji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile.   Onye m na-ekwu maka ya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of the Order of Niger ‘(MON).   Od

Egwu ndị Igbo: Egwu ikpem/nkọcha

EGWU ikpem maọbụ egwu nkọcha bụ egwu ndị Igbo ji akọcha ihe ọjọọ. Ha na-eji ya akọcha ihe ọbụla adabaghị otu o kwesịrị ịdị.   Ịmaatụ, ọ bụrụ na mmadụ ezuo ohi maọbụ nwaagbọghọ atụrụ ime n’alụghị di, ndị Igbo na-eji egwu dị otu a akọcha ma katọọ agwa ọjọọ dị otu ahụ. Uru ụdịrị egwu a bara bụ na ọ na-eme ka mmadụ kee nkwụcha ma mata na ụkwụ na-aga wara wara, anya na-aga wara wara na-ahụ ya.   Egwu ikpem maọbụ egwu nkọcha na-atọ ma okenye ma ụmụaka ụtọ. Mgbe ọbụla ihe dị aṅaa mere n’obodo, a na-atụ anya na a ga-ewepụta egwu a ga-eji katọọ ya. Ịmaatụ:  Onye ohi azụ — Azụ azụ mangala Onye ohi azụ—- Azụ azụ mangala Tabakwa azụ —- Azụ azụ mangala

Egwu ndị Igbo: Egwu ụmụada

ỤMỤADA maọbụ ụmụọkpụ bụ ụmụnwaanyị a mụrụ n’otu ezinaụlọ, ụmụnna, ogbe, obodo wdg. Ụmada n’ogo ọbụla na-anọ n’otu. Ha na-eji otu obi eme ihe ma were otu olu na-ekwu.   Ya mere, ụmụada dịka ndị Igbo bụ agbụrụ na-agụ egwu na-eji egwu egosipụta ebumnuche ha. Obi dị ha mma ha na-eji egwu egosiputa ya, otu ahụ ka ha na-emekwa ma obi dị ha njọ. Ya mere, ihe dịka mgbe ọbụla e nyere ha ihe onyinye ha na-eji egwu gosipta afọ ojuju ha nwere. Ọmụmaatụ egwu ha na-agụ n’oge dị otu ahụ bụ: Okeke eee – Dị ebube Okeke eee- Dị ebube Anyị ga-amagharị akwa n’ụdị ọzọ- O nwere ihe ọ bụ?

Egwu ndị Igbo: Egwu nwa

NWA bụ oke ihe n’ala Igbo tinyere ụwa niile gbaa gburugburu. A na-elekọta nwa anya ka ọ ghara inwe nsogbu.   Ya mere, a na-ekwu na nwa bụ nwa ọha n’ihi na ọ dịịrị onye ọbụla ilekọta nwa.   Egwu a na-agụrụ nwa bụ atụrụ taba n’ihi na nke ọbụla nwere oge ya. Ọmụmaatụ: Egwu e ji agụgụ nwa mgbe ọ na-ebe akwa Nwanne m ghara akwa – dongo Akwa adịghị mma  – dongo Ọchị kacha mma – dongo dongori dongori dongo

Egwu ndị Igbo: Egwu Ekpiri ka na-agakwa n'ihu

 N’EGWU ndị Igbo nke izuụka a anyị ka na-agakwa n’ihu maka egwu ekpiri. Ihe kpatara ya bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị Igbo bụ a kwaa a kwụrụ n’egwu ekpiri, ya mere agaghị akọ maka egwu ekpiri hapụ itinye aha ha.   Na nke izu a, onye anyị ga-egosị ụwa bụ Chief Stephen Osita Osadebe. A na-akpọkarị ya Osadebe, ọ bụ otu n’ime ọ ka ibe e nwere n’egwu ekpiri. Ọ bụ onye Atani nke dị n’okpuru ọchịchị Ogbaru na steeti Anambra. A mụrụ ya na Maachị 1936.Ọ malitere ịkụ agwu oge ọ dị afọ iri abụọ na atọ. Ọ kụrụ egwu ekpiri ma gbasaara ya ụwa niile ihe karịrị afọ iri anọ; site n’afọ 1958 ruo n’afọ 2007. Ọ nwụrụ ka ọnwa Mee dị n’abalị iri na otu n’afọ 2007 n’ụlọọgwụ Saint Mary’s Hospital Waterbury, Connecticut United States.   Egwu ya gụnyere: Osọndị owendị, Kedụ America, Sisi kwanangida, Ọnụ kwube, Ife onye metalụ.

Egwu ndị Igbo: Egwu ifo

EGWU Ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu a na-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo.   Dịka anyị maara, akụkọ ifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha omenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọ banyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere aka wee na-aga.   A na-akọkarị akụkọ ifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike.   Ọtụtụ akụkọ ifo na-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ a na-ekwe. Ọmụmaatụ egwu ifo: Mbe agaba ……… Ajambene Mbe agaba ………. Ajambene Gaagaagaagaa … Ajambene   Otu o sila dị, o nwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. O ji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile.   Onye m na-ekwu maka ya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of the Order of Niger ‘(MON).  

Egwu ndị Igbo : Egedege

EGEDEGE  bụ egwu ndị Igbo na-agba. Ha malitere ya mgbe ụwa dị n’ụra. Ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị na-agba egedege.   N’oge ahụ, ndị ntorobịa na-agba egedege n’egwu ọnwa.   Ejiji e ji agba egedege na-adị iche. Ụmụnwaanyị na-akpa ụdị isi dị iche iche.   Mgbe elu bụ ala ọsa, ha na-akpa isi okpoko, isi ego, nkonyerenantị w.d.g. Ha na-etekwa uhie, dee uri, yiri jigida n’ukwu, ma gbara nja n’ụkwụ.   Dịka a na-agba egedege, ụfọdụ na-akụ akụ, ụfọdụ na-agba agba, tinyere ndị na-agụ agụ. E ji ngwa egwu dị iche iche akụ ya, ndị gụnyere: ịchaka, ọkpọkọrọ, ogene, aro, udu, ọja w.d.g. Ọja dị nnukwu mkpa n’egwu egedege makana ọ bụ ya na-ezipụta ihe a na-eme.   Obodo dị iche iche agbaala egedege, ma na-agba ya ruo taa. Ma obodo e jiri mara egedege bụ Unubi, nke dị na Nnewi South na steeti Anambra. Onye na-agụpụta ya bụ Queen Theresah Onuora nke Original Egedege Dance. Ọ bụ odogwu nwaanyị ahụ mere na egedege na-ada ụda n’ụwa niile taa.   Theresa Onuora (Queen of egedege dance) malitere egwu egedege n’afọ

Egwu ndị Igbo : Nkpọkịtị

NKPỌKỊTỊ bụ ọpụrụ iche dị n’egwu e nwere n’Igbo. E hibere ya n’ala Umunze nke dị n’okpuru ọchịchị Orumba South (ochie Aguata) n’afọ 1959. Ọ bụ odogwu nwoke, Chief Festus Okoli lagoro mmụọ, onye e ji Ojimgba mara (1927-2009), hibere ya.   Nkpọkịtị Umunze (Nkpọkịtị Unique Cultural Dance Group) dịka ndị mmadụ na-akpọ otu egwu ahụ na-eji ụzọ dị iche iche (styles) nke gụnyere irigo n’elu onwe ha wee na-eme ndị na-elele ha obi ụtọ. N’ikwu eziokwu, ọ gbara ụwa gharịị etu ha si agba egwu.   Ha gara asọmpi dị iche iche n’ala anyị bụ Nigeria ma turu ugo lọta. N’afọ 1970, dịka steeti niile gbakọtara ka a ṅụrịa maka agha a kwụsịrị; ha gbara ndị nke mbụ wee turu ugo buru ihe onyinye ha laa.   Otu ahụ ka ha si aga asọmpi ma na-agba ndị nke mbụ oge niile.N’ihi ya, gọọmenti Anambra steeti ochie họọrọ ha dịka egwu steeti ji aga asọmpi egwu ọdịnala.   Dịka ha na-aga n’ihu na-eturu ugo n’ike n’ike n’asọmpi ala anyị, Gọọmenti Etiti kpọrọ ha gaa mba ụwa. Ya mere, n’afọ 1978 ha gara asọmpi na Wernbley Engla

Egwu ndị Igbo: Atilọgwụ

ATỊLỌGWỤ bụ egwu e ji mara ndị Igbo. Ụmụikorobịa obi na-anụ ọkụ na-agba ya n’ihi na ọ bụghị egwu onye ike adịghị. A na-agba ya n’ọkụ n’ọkụ.   Atịlọgwụ so n’egwu ndị Igbo na-agba mgbe elu bụ ala ọsa. Ọ bụ ochie egwu n’ala Igbo nke a na-agba na mmemme dị iche iche dịka emume ofala, iri ji ọhụrụ, emume ọdịnala,ịgba nkwụ,akwamozu w.d.g.   Ụzọ e si agba ya na-adị egwu nke kpatara ndị lelere ya mgbe a malitere gbaba ya mbụ jiri jụrịta onwe ha ma e tinyere ọgwụ n’egwụ ahụ. Ọ bụ ya kpatara e ji gụụ ya, atịlọgwụ.   Ọ bụ ngwa egwu Igbo ka e ji agba ya dịka ogene, ịchaka, ọkpọkọrọ, ọja na ndị ọzọ.   A maara egwu atịlịọgwụ nke ọma n’ala anyị ma na mba ndị ọzọ.Ọ gazuola ụwa niile eme o nwetara ọtụtụ nturuugo.

Egwu ndị Igbo: Egwu ekpiri

EGWU ekpiri (highlife music) so n’egwu e jiri mara ndị Igbo. E ji ngwa egwu dị iche iche ndị Igbo nwere wee na-akụ ya. Ka a na-akụ nkwa ka ọ gụ egwu na-agụ.   Mike Ejeagha so n’onye e ji egwu ekpiri wee mara. Ọ na-agụ nke ya n’ụdị akụkọ n’egwu. Nke a pụtara na ọ na-akọ akụkọ n’ime egwu ọ na-agụ.   Akụkọ ndị ahụ ọ na-akọ mere ka egwu ya na-atọ ụtọ n’ụzọ dị egwu. Onye ọbụla na-ege egwu ya na-anọgidesi ike na-ege ya n’ihi na onye ahụ ga-achọrịrị ịmata ihe mere na ngwụcha akụkọ ahụ. Ọ bụ ya na-ede egwu ya, na-agụ, ma na-eji ilu Igbo wee na-eme ka o nye ihe a chọrọ.A na-akpọkwa jita n’usoro bụ ịgba na ya.   A mụrụ Mike Ejeagha, onye ndị na-enwe mmasị n’egwu ya (fans) na-akpọ Gentleman n’Ọgọstụ 1932 n’Imezi Owa nke dị na steeti Enugu. Ọ malitere ịgụ egwu mgbe tere aka. Egwu ya agazuola mba ụwa. Ọ bụ n’afọ 1960 (afọ ala anyị nweere onwe ha) ka ọ kụpụtara egwu izizi dara ụda.   Egwu ya gụnyere; Onye ori ụtaba, Ebini nwe ude, Ife ụwa bụ a na-eme ọ dịka adị eme, Ụwa mgbede ka mma na ọtụtụ ndị ọz

Egwu ndị Igbo: Egwu arịrịọ

N’IHI nsogbu ụwa, ụfọdụ ndị mmadụ na-ahụta onwe ha n’ọnọdụ irịọ arịrịọ. Ndị dị otu ahụ na-abụkarị ndị kpuru isi, ndị dara ngwọrọ,ndị merụrụ ahụ dị iche iche w.d.g.   Ndị Igbo dịka anyị maara abụghị agbụrụ e jiri ịrịọ arịrịọ mara, mana otu o sịla dị, ọ bụ ihe mere ede ji bee nwịị n’ihi na ejighị anya ọma aga ụka ekpere.   Ya mere, mgbe ọbụla onye Igbo hụtara onwe ya n’ụzọ dị otu ahụ, ọ na-ejikarị egwu arịọ arịrịọ. Mgbe ụfọdụ ha na-aga otu otu, abụọ abụọ maọbụ n’igwe.   Ọmụmatụ egwu e ji arịọ arịrịọ bụ: Nyerenụ m aka oo – meere m ebere (2x) Onye na-arịọ arịrịọ – ka onye ohi mma Nyerenụ m aka oo – meere m ebere.

Egwu ndị Igbo: Egwu ifo

EGWU ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu a na-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo. Dịka anyị maara, akụkọ ifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha omenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọ banyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere aka wee na-aga. A na-akọkarị akụkọ ifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike. Ọtụtụ akụkọ ifo na-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ a na-ekwe. Ọmụmaatụ egwu ifo: Mbe agaba ……… Ajambene Mbe agaba ………. Ajambene Gaagaagaagaa ……….. Ajambene Otu o sila dị, o nwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. O ji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile. Onye m na-ekwu maka ya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of the Order of Niger ‘(MON). Odogwu n

Egwu ndị Igbo: Egwu mgba

MGBA so n’otu egwuregwu ndị Igbo ji enwe obi aṅụrị. Ma nwoke ma nwaanyị tinyere okenye na ụmụaka na-enwe mmasị n’ihe gbasara ịgba mgba.   A na-agbakarị mgba n’ama egwuregwu obodo ọ kacha ma a na-eme emume dịka ịwa ji ọhụrụ w.d.g. Ọ na-abụkarị n’ụzọ asọmpi. Ogbe dị iche iche na-ewepụta onye kacha agba mgba na be ha ka dimkpa na ibe ya kwe n’aka ka a mara aka ka aka. N’ikpe azụ ndị tuuru ugo ga-enwe mmeri.   Ụmụaka na-agbakwa mgba n’egwu ọnwa. A bịa na ya, ha na-eji ya emekwa ihe egwuregwu ma na-enwe ọṅụ.   N’ala Igbo ọ bụ eziokwu na onye ọbụla na-enwe mmasị na mgba, ọ bụ sọ ụmụnwoke na-agba mgba. Ụmụnwaanyị na-ekiri ekiri.   N’ihi otu ndị Igbo si hụta ịgba mgba, ndị na-agba mgba nke ọma na-eji ya aza aha dịka: Ọkamgba, Dimgba, Azụeruala.   Ka a na-agba mgba ka a na-agụ egwu mgba maka na mgba na egwu na-agakọ ọnụ. Ndị Igbo dịka agbụrụ na-agụ egwu na-eji ekere mgba amalite tupu ebido mgba.   Ọmụmụatụ egwu mgba: Onye taa ose ọ hụ n’anya … Na-akụrụ m ịgba. Onye taa ose ọ hụ n’anya … Na-akụr