Egwu ndị Igbo: Egwu mgba
MGBA so n’otu egwuregwu ndị Igbo ji enwe obi aṅụrị. Ma nwoke ma nwaanyị tinyere okenye na ụmụaka na-enwe mmasị n’ihe gbasara ịgba mgba. A na-agbakarị mgba n’ama egwuregwu obodo ọ kacha ma a na-eme emume dịka ịwa ji ọhụrụ w.d.g. Ọ na-abụkarị n’ụzọ asọmpi. Ogbe dị iche iche na-ewepụta onye kacha agba mgba na be ha ka dimkpa na ibe ya kwe n’aka ka a mara aka ka aka. N’ikpe azụ ndị tuuru ugo ga-enwe mmeri. Ụmụaka na-agbakwa mgba n’egwu ọnwa. A bịa na ya, ha na-eji ya emekwa ihe egwuregwu ma na-enwe ọṅụ. N’ala Igbo ọ bụ eziokwu na onye ọbụla na-enwe mmasị na mgba, ọ bụ sọ ụmụnwoke na-agba mgba. Ụmụnwaanyị na-ekiri ekiri. N’ihi otu ndị Igbo si hụta ịgba mgba, ndị na-agba mgba nke ọma na-eji ya aza aha dịka: Ọkamgba, Dimgba, Azụeruala. Ka a na-agba mgba ka a na-agụ egwu mgba maka na mgba na egwu na-agakọ ọnụ. Ndị Igbo dịka agbụrụ na-agụ egwu na-eji ekere mgba amalite tupu ebido mgba. Ọmụmụatụ egwu mgba: Onye taa ose ọ hụ n’anya … Na-akụrụ m ịgba. Onye taa ose ọ hụ n’anya … Na-akụr