Posts

Showing posts with the label Egwu ụmụnwaanyị

Egwu ụmụnwaanyị

N’ALA Igbo, ụmụnwaanyị na-agba egwu dị iche iche. Ha na-agbaegwu site n’otu dịka ụmụada, nlụdi/inyom ọna, otu ọgbọ, ụmụnna, ogbe w.d.g.   Ha na-amụ egwu siten’ịkpọ ndị o doro anya ka ha bịa kụziere ha. Ha na-amụ egwu ọtụtụ oge ganye naha amụtachaa ya.   Mgbe ha mụtachara,ha na-ebuputa ya n’ọha obodo ka ndị mmadụ hụrụ. Ha na-ebuputakarị egwu n’oge enwere nnukwu emume dịka iri ji ọhụrụ. Ndị mmadụ na-agbakọba ọnụ lelee ma kwadoha.   Egwu na-enweta ezimmekọrịta n’etiti ogbe na ogbe, obodo na obodo w.d.g.   Ụmụnwaanyị na-achọonwe ha mma, site n’ide uri na iji ejiji dị iche iche. Egwu ụmụnwaanyị na-adịegwu ma na-akwalite ọdịnala Igbo.