Egwu ndi Igbo: Egwu n’ifo
EGWU Ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu ana-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo. Dịka anyị maara, akụkọifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ haomenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọbanyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere akawee na-aga. A na-akọkarị akụkọifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike. Ọtụtụ akụkọ ifona-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ ana-ekwe. Ọmụmaatụ egwu ifo: Mbe agaba……… Ajambene Mbe agaba………. Ajambene Gaagaagaagaa Ajambene Otu o sila dị, onwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. Oji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile. Onye m na-ekwu makaya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steetiAnambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of theOrder of Niger ‘(MON). Odogwu nwaanyị