Posts

Showing posts with the label Edo 2020

Edo 2020: Obiano anabatala ndị Anambra tuuru ugo, gbáà ha ume

GỌỌMENTI steeti Anambra nọrọ n’izuụka a wee nabata ụmụafọ steeti ahụ tuuru ùgo ma nweta ihe nrita dị iche iche n’asọmpi egwuregwu ala Nigeria ahụ e mere na steeti Edo,bụ nke a kpọrọ Edo 2020.   Mmemme ịnabata ndị a bụ nke weere ọnọdụ na be aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, dị n’Agụleri, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’, ma bụrụkwa nke Gọvanọ Obianọ nọrọ na ya wee naa ha aka, ma gbàkwa ha ume n’aha gọọmenti steeti ahụ.  Ndị ahụ tuuru ùgò bụ ndị ọgbaọsọ, ma bụrụkwa ndị ritere ihe nrite ruru iri atọ na asaa n’ọnụọgụgụ, nke gụnyere ọlaedo isii, ọlaọcha iteghete, na ọlanchara iri abụọ na abụọ; ma bụrụkwa ndị onye na-ahụ maka nkwalite egwuregwu na steeti ahụ, bụ Maazị Tony Oli.   N’okwu ya oge ọ na-anabata ndị ahụ, Gọvanọ Obianọ nàrà ha aka maka itube steeti ahụ ùgò, ma kọwaa na nke ahụ bụ nnọọ igosipụta mmụọ Onye Anambra, maka na Anambra na ụmụafọ ya na-emewanye nke ọma oge niile ma na-ebutekwa ụzọ n’ezi ihe niile.   Ọ gwara ndị ahụ ritere ọlaedo ka ha jidesie ya ike