Aka akparala ndị nta gbara ndị gara akwamozu égbè n'Edo
NDỊ uweojii na steeti Edo ejidela ma kpọchie ndị nta abụọ maka ịgba ndị jere akwamozu égbè, ma jirikwa égbè merụsịa ha ahụ kà a ga-asị na ha bụ anụ oriri. Ihe ọdachi a bụ nke dapụtàrà n’obodo Ama dị na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo ‘Esan South-East’ nke steeti Edo, ma bụrụkwa nke ndị nta ahụ sitere na ya wee merụọ mmadụ isii àhụ n’ime ndị ahụ gara akwamozu Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii steeti ahụ, bụ SP Kontongs Bello siri kọwaa, onyeisi ndị uweojii na mpaghara ụlọọrụ uweojii ‘Agbede Division’ bụ CSP Iredia Ogiata nwètèrè ozi banyere égbè a na-agba n’obodo ahụ. O kwuru na oge ha nwetechara ozi ahụ, na ya bụ onyeisi ndị uweojii jikọtara ndị ọrụ ya, ha wee gaba n’ebe ahụ ya bụ ihe na-eme. Ka ha ruzịrị n’ebe ahụ, ha hụtazịrị na ndị nta ahụ jiri egbe nwere ọnụ abụọ wee gbaa ma merụọ mmadụ isii ahụ n’ebe a na-akwa ozu n’obodo ahụ, bụ mmemme akwamozu otu onye, bụ Martina Rabi lagoro mmụọ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ndị nta ahụ sòrò ndị