Posts

Showing posts with the label Ebube agụ

Nchekwa obodo: Ndị gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ehibela Ebube agụ

N’ỊGBAKWỤNYEKWU n’ezi agbambọ ha n’iweghachi ezi ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ, òtù ahụ jikọtara ndị gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria a maara dịka ‘South-East Governors Forum’ nọrọ na nsonso a wee wepụta ma hibe atụmatụ nchekwa pụrụ iche maka mpaghara ahụ.   Atụmatụ nchekwa ọhụrụ ahụ a kpọrọ “Ebube Agụ” bụ nke ndị gọvanọ ahụ hibere na nnukwu ọgbakọ nchekwa pụrụ iche ndị òtù ahụ nwere, ha na ndịisi ngalaba ọrụ nchekwa dị iche iche na mpaghara ahụ, bụkwa nke weere ọnọdụ n’Owerri, bụ isi obodo steeti Imo.   Ya bụ ọgbakọ bụ nke dọtara ndị gọvanọ niile nke steeti ise e nwere na mpaghara ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee lebàá anya n’ihe dị iche iche metụtara mpaghara ahụ na ndị Igbo n’izùgbe.   N’okwu ya oge ọ na-ewepụta mpụtara ihe e metere na nzukọ ahụ nà nkwekọrịta ha nwere, onyeisioche òtu ahụ jikọtara ndị gọvanọ ahụ, ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Umahi mèrè ka a mara na ndị òtù ahụ, nke gụnyere Gọvanọ Willie Obianọ nke steeti Anambra; Gọvanọ Hope Uzodimm