Posts

Showing posts with the label Ebube Mụọnsọ

COVID-19: Ebube Mụọnsọ ekesàárala ndị nọ na mkpa ihe oriri

Image
N’IJI tụnye ụtụ nke ya n’ime ka oge a a nọ n’ime ya gharaibì ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’ebe ọ dị ukwuu, onyeisi na onye ndu ime mmụọ nke ụlọekpere‘Holy Ghost Adoration Ministry, Uke’ dị na steeti Anambra, bụ Ụkọchukwu OseburuụwaEmmanuel Obimma (a maara dịka Ebube Muonso) ekesàárala ụmụafọ Nigeria karịrịpuku anọ ihe erimeri dị iche iche. Mmemme nkesa ihe ndị ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka‘Blessed Iwene Tansi’ dị n’Ụmụdiọka, ma bụrụkwa nke a nọ na ya wee kesàárá haihe erimeri dị iche iche, nke gụnyere akpa osikapa, mba ji, igbe ‘indomie’,mmanụ nkwọchasị aka (bụ hand sanitizer), tinyere ihe ndị ọzọ. Ka ọ na-ekesà ihe ndị ahụ, Ebube Mụọnsọ kwuru na ya mụtarainye enye site n’aka ‘Most Reverend’ Valerian Madụka Okeke, nke ụka KatọliikiAshịdayọsiisi Ọnịtsha, bụ onye ọ kọwara dịka ezi ọmụmatụ nke onye na-enye. O kèlèkwara otu oke ényì ya, bụ Maazị Obiọrah Okonkwọ, bụonye zọbụrụ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ n’oge gara aga, maka ibute ya bụ mmanụnkwọcha aka ‘hand sanitizer’ ahụ e kesààrà ndị mmadụ ụbọch