Posts

Showing posts with the label Ebube Igbo

Ndị Ebube Igbo emeela ụbọchị omenala Igbo nke afọ 2019

ỊMA mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụtàrà nnọọ ìhè nso-nso a n’Abagana dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, dịka òtù a mààra dịka ‘Ebube Igbo Association of Nigeria’ chịkọbàra ma merùbe mmemme ụbọchị omenala Igbo nke ahọ 2019. Oke mmemme ahụ nke ahọ a, bụ agba nke abụọ ya, bụkwà nke a nọrọ na ya wee kpọọ òkù, site n’okwu na site n’ihe ngosi, banyere itute, ichekwaba na ịkwàlite asụsụ, omenala, ọdịnala na njirimara Ndị Igbo n’ụwa gbaa gbùrùgbúrù. Ka ọ na-akọwàpụta ihe bànyere mmemme ahụ, onye chọpụtàrà ma bụrụkwa onyeisi òtù Ebube Igbo, bụ Maazị Chistopher Mbanụ mere ka a mara na ha na-esite na ya bụ ihe mmemme wee na-atụnye ụtụ nke ha n’ịkwàlite omenala Igbo. Ọ kwàrà arịrị na omenala Ndị Igbo, ọ kachasị asụsụ ha na-anwụnyụzị anya ugbu a, nke mezịrị o jiri dị mkpa na onye ọbụla bụ ezi nwa afọ Igbo ga-atụnya ụtụ ma tinye aka n’ọrụ, iji zọpụta ma hụ na ya bụ asụsụ efùghị dịka òtù mba ụwa United Nations Educational Scientific, and Cultural Organization (UNESCO) bùrù n’am