Posts

Showing posts with the label Ebonyi

N'Ebonyi, ndị uweoji anwụchikọọla mmadụ anọ maka ịma nwata nwaanyị elu n'ike

NWATA nwaanyị gbara afọ iri na asaa, aha ya bụ Chioma, onye Okposi dị n’okpuru ọchịchị Ohaozara na steeti Ebonyi akọwaala ka ndị otu nzuzo mmadụ anọ siri maa ya elu n’ike n’ogbe ahụ.   Kọmandị ndị uweojii steeti ahụ kwuru na a nwụchikọọla ndị omekome ahụ ma kpụpụkwa ha ụlọikpe.   Chioma kwuputara na ụfọdụ ndị ahụ mara ya elu n’ike n’ụlọ oriri na ọńụńụ bụ ndị rịọrọ ya enyi n’oge gara aga, ma bụrụkwa ndị okwetaghị ka ha bụrụ enyi.   Ya bụ nwata nwaanyị agụchaghị kọlejli (dropout) kọwapụtala nke ahụ n’isi ụlọọrụ ndị uweojii, Abakalili.   O kwuru sị: “Ana m ala n’ụlọ oge m zutere ụfọdụ ụmụnwoke ndị rịọrọla m enyi, ndị m gwara na mụ achọghị.   Ha malitere chụba m ọsọ ka ha tie m ihe ma agbalagara m. Ụbọchị ụka ha bịara n’ụlọ m kpọrọ m gaa ụlọ oriri na ọńụńụ Romic Hotel ebe ha niile nọrọ maa m elu n’ike n’otu n’otu. Ha dị mmadụ anọ mara m elu n’ike n’ụlọ oriri na ọńụńụ ahụ.”   Chioma gara n’ihu kọwaa na ya anọghịzị n’ụlọakwụkwọ, na ya bụ onye na-erere mmadụ ahịa. O kwuru na ya kwụsịrị kọleej

N'Ebonyi, a chụpụla otu pastọ, gbaa ngwogwo ya ọkụ

NDỊ Ndiechi Onuebonyi n’Igbeagu dị n’okpuru ọchịchị Izzi na steeti Ebonyi nọ n’oke egwu na ụjọ n’ihi nchọpụta ha hụrụ na otu nwoke bi n’etiti ha kemgbe afọ iri na otu dịka pastọ abụghị ihe ha chere ka ọ bụ; na ọ bụ onye ozi ekwensu.   Ha kọwara na nwoke ahụ dị ihe dịka afọ iri asaa, aha ya bụ Ezekiel Anyia Nweke, bụ pastọ ụlọụka Yahweh Kingdom Community Worldwide, Ndiechi Onuebonyi, na njikọụzọ Obubra n’Igbeagu tinyere aka n’ọtụtụ ihe ọjọọ na-adakwasa ndị nke ha, nke gụnyere e je eje, a la ala.   Oge igwe mmadụ iwe na-ewe wakporo ụlọụka ya ma malite na-atụpụ ngwongwo ya iro, ha hụtagara ihe dị iche iche a na-ahụ na nke dibịa. Ihe ndị ahụ gụnyere ihe a tụrụ atụ, osisi mkpuchi (mask) dị oji na-eyi egwu, igodo cheenu, mpi anụmanụ, akwa njide ara (bra) ụmụnwaanyị, mma ọdụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. E nwetekwara mkpara osisi (wooden baton) nke e dere ‘His Excellency, Engr David Umahi, Executive Governor, Ebonyi State’ na ya.   E kwuru na ndị obodo ahụ, ọ kachasị ndị ntorobịa, ka ha hụchara ihe n

Ndị omekoome agbaala ụlọọrụ INEC abụọ ọkụ n'Ebonyi

N’IJI gbakwụnyekwuo na nsogbu na ihe ọdachi dị iche iche na-adapụtasị na mpaghara ebe dị iche iche na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ndị omekoome ámághị ndị ha bụ, nọrọ na nsonso a wee mụnye ọkụ n’ụlọọrụ abụọ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission’ (INEC), na steeti Ebonyi; ọkụ wee gbarikọọ ụlọ abụọ ahụ na ihe dị n’ime ya.   Ụlọọrụ abụọ ahụ a gbara ọkụ n’abalị ụbọchị Tuzdee dị na mpaghara okpuru ọchịchị ‘Ezza North’ nke steeti ahụ, ma bụrụkwa nke mere ka ọ fọdụrụ awà olenaole ka a malite ọgbakọ ndịisi ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ nchekwa chọrọ inwe ụbọchị Wenezdee banyere mwakpo ndị omekoome na-awakpò ụlọọrụ INEC.   Ndị ọnọmgbeomere mèrè ka a mara na ọkụ ahụ gbarikọrọ ụlọọrụ abụọ ahụ gwoogwoo, ma gbapịa akwụkwọ dị iche iche dị oke mkpa na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ebe ahụ.   N’okwu nke ya banyere nke ahụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ INEC na steeti Ebonyi, bụ Maazị Cornelius Ali, gbàrà akaebe na ndị omekoome gbara ụlọọrụ ha ọkụ

N'Ebonyi, agbaala ụlọikpe ukwu Abakaliki ọkụ

NDỊ ojiegbe agbaala ụlọikpe ukwu (Federal High Court), Abakaliki nke steeti Ebonyi ọkụ.   Ụlọikpe ahụ dị n’ụzọ awaraawara Enugu/Abakaliki na ncherịta ihu offiisi Peoples Democratic Party nke steeti ahụ.   E kwuru na ọ bụ na Tuzdee ka ya bụ ihe mere ma bụrụkwa nke ndị omekome ji ogbunigwe (petrol bombs) wee mee.   Ọkụ ọgbụgba ahụ nke bidoro n’ụzọ ụzọ ụtụtụ wee gbaba metụtara ọba akwụkwọ na mpaghara ndị nche nke ụlọikpe ahụ.   Otu o sila dị, a gbatara ọsọ wee menyọọ ọkụ ahụ tupu ihe riri ụtara arachapụ ofe.   Onweghị onye tụfuru ndụ ya na ya bụ ihe bụ nke mebiri ihe ndị (records) ụlọikpe ahụ chekwara n’ọba akwụkwọ.   Onye okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, Loveth Odah kwuru na ya bụ ihe mere n’ezie. Ọ kọwara na ndị ahụ kpara mkpamkpa ahụ bịara n’igwe wee kpaa arụ ahụ.   Ka anyị cheta na ọtụtụ steeti agabigala mwakpo n’ebe ndị ọrụ nchekwa nọ.   Na steeti Imo, ndị oji egbe wakporo gbaa ụlọ gọvanọ steeti ahụ bụ Hope Uzodimma ọkụ na nso nso a ma gbuo ndị nche nọ na ya.   Ọtụtụ ndị mmad

N’Ebonyi, eliela ụmụakwụkwọ ise nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ

Image
Ọ BỤ ihe oke anya mmiri ka ụlọakwụkwọ St Michael’s Schools, Oshiri nke dị n’okpuru ọchịchị Onicha na steeti Ebonyi liri ụmụaka ise bụ ndị nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.  Ụmụaka ahụ ndị nọ na ngalaba prịma n’ụlọakwụkwọ ahụ, Chiemerie Ngwe, Prosper Ogudu, Toochukwu Nwafor, Peace Ifeanyichukwu na Divine Nworu ka e kwuru na ụgbọala tanka mmiri kwọriri ha n’Onu Orie Agu dị n’Oshiri. Ọnwụ ụmụaka ahụ tinyere obodo ahụ n’ọnọdụ iru ụjụ kemgbe ahụ.   Otu o sila dị, ndị nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ kwuru sị na ụmụaka ahụ, ndị nke a na-akpọzi obere ndị nsọ (five little saints) anwụghị na nkịtị. Ya mere, ha mere ka ha dị ọkpụtọrọkpụ (immortalisation) site n’ịba otu ebe ụgbọala na-akwụsị ‘bus stop’ aha ha. Ebe ụgbọala na-akwụsị dị na mbata ụlọakwụkwọ ahụ ka a bara ‘Five Little Angels Bus Stop’ iji wee na-echeta ụmụaka ahụ nwụrụ n’ihe mberede.   N’okwuchukwu ya n’aja maasị dị asọ akwamozu ahụ nke ụka katọlik dayọsis Abakaliki chịkọbara, Fada Matthew Opoke kwuru na a chịkọbara emume ahụ n’ihi ụmụaka ahụ aka

N'Ebonyi, a tụnyela nwata nwoke afọ iri n'ọkụ maka izu ohi osikapa

ỤMỤNWOKE abụọ atụnyela nwata nwoke gbara afọ iri aha bụ Ifeanyi Umoke n’ọkụ n’ihi na  o zuru ohi iko osikapa olemole n’ahịa Inikiri.   Umoke, bụ onye Inikiri dị n’Effium n’okpuru ọchịchị Ohaukwu na steeti Ebonyi ka e kwuru na e kechiri ya aka abụọ na ụkwụ abụọ tupu a tụnye ya n’ikpo ahịhịa dị n’azụ ahịa ahụ ka ọkụ gbagbuo ya ka ewu.   Dịka e siri kwu, ya bụ ihe mere oge ahịa na-ekwo ekwo, n’ihi ya ndị o metụrụ n’obi zọpụtara nwata nwoke ahụ nke mere na o zuteghị ọnwụ ya n’ike dịka ha siri kwadoro ya. E kwuru na ọ bụ ihe isi ike tinyere ya n’ịkpa agwa ahụ n’ihi na ọ nọ n’ajọ ọnọdụ oke agụụ kemgbe nne ya nwụchara.   Nna ya bụ onye kara ị na-elekọta ya anya ka e kwuru na ọ na-arịa ọrịa isi mgbaka nke dị egwu, n’ihi ya, o nweghị ihe o nwere ike ime.   Ya mere dịka ndị ụmụnna ya gbahapụrụ ya, ọ makwaghị ihe ọ ga-eme karịa ịrịọ arịrịọ ihe oriri iji wee dị ndụ.   Otu onye gwara ndịntaakụkọ na e kechiri nwata ahụ aka na ụkwụ tupu a tụnye ya n’ọkụ na-enwu n’ikpo ahịhịa. Na ndị o metụtara n’obi