N'Anambra, Ekweoba arụọrọla nwaanyị ajadụ ụlọ ọhụrụ n'Ebenebe
MKPU ọñụ dara na nsonso a, dịka otu nwaanyị ajadụ nwètara onyinye ọmarịcha ụlọ ọhụrụ site n’aka otu nwoke ọrụ obi ebere na-amasị na steeti Anambra. Ya bụ ọmarịcha ụlọ ọhụrụ bụ nke a rụụrụ nwaanyị ajadụ ahụ bụ Oriakụ Philomena Ubaka n’Ebenebe dị n’okpuru ọchịchị ‘Awka North’ site n’aka Maazị Ekweoba Arnold Ebuka bụ onyeisi ótù ụlọọrụ nnọronwe na-ahụ maka ewumewu ụlọ, bụ ụlọọrụ ‘Arnold and Associates’. Nwaanyị ajadụ ahụ bụ onye ya na ụmụ ya bi n’ochie ọkpọkịrị ụlọ e jiri gbamgbam na ákwà wee kpuchie, wee ruo n’ahọ 2017, mgbe ótù òtù ọrụ obi ebere nnọrọonwe a maara dịka ‘Restore a Radiant Smile Foundation’ zutèrè ya wee hụta ajọ ọnọdụ ya na ụmụ ya nọ na ya na ihe ha na-agabiga. N’okwu ya oge ọ na-enyefe nwaanyị ahụ ya bụ ụlọ ọhụrụ na igodo ya, Maazị Ekweoba mere ka a mara na ya ahụtụbéghị nwaanyị ahụ anya nke mbụ wee ruo ụbọchị ahụ ọ bịara inyefè ya ụlọ ahụ kpọmkwem. O kwuru na ọ bụ n’ahọ gara aga ka ótù òtù nnọrọonwe zutèrè ya wee kọọrọ ya akụkọ banyere nwaanyị ahụ, nke mere ka an