Akaegbobi arụọrọla ndị Ebenator ụlọ ahụike, gbapuoro ndị Ukpor mmiri
N’IMEZÙPỤTA nkwà onkwere mgbe ọ na-achụ nta nkwado ọchịchị,onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi South’ nke abụọ n’ụlọ omeiwusteeti Anambra, bụ Maazị Johnbosco Akaegbobi nọrọ na nso-nso a wee rụọrọ manyefèé ndị Ebenator ọmarịcha ụlọ ahụike ọhụụ ọ rụụrụ ha, ma nyéfèkwa ndị Ukpormmiri ọñụñụ ọ gbapùùrù ha. Ya bụ ụlọ ahụike bụnke a rụrụ n’ógbè Umuonyeukpa dị n’Ebentor, ma bụrụkwa nke a nọrọ na nso-nso awee gbapee site n’aka Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ DọkịtaVincent Okpala. N’okwu ya na mmemmeahụ, Maazị Akaegbobi kọwara nke ahụ dịka otu n’ime ọrụ ọgbọ nta nkwàdo o jin’aka, ma bụrụkwa nke dị obodo ahụ oke mkpà n’ihi na ha enwebụghị ogìgè ụlọ ahụike‘Primary Healthcare Centre’ n’oge mbụ. O kèlèrè ụmụafọobodo ahụ maka ịkwàdo ya n’ụzọ dara ụda oge ọ na-achụ nta nkwàdo, ma kelekwaMaazị Chuddy Atuchukwu na Maazị Arinze Chukwudebelu, bụ ndị bunyere ụlọ ahụike ọhụụahụ mkpụrụ ọgwụ na akụrụngwa ahụike dị iche iche iji kwàdo ọrụ ahụike n’ebe ahụ. Ọ kpọpụtasịkwara ụ