Ndị Ebenatọ eriela ji ọhụrụ
Rịọ enyemaka gọọmenti maka mbize ha Izunna Okafor Ọ BỤ nnọọ ụwa bịa kirie ụbọchị Tuzdee gara aga, dịka ndị obodo Ebenatọ dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018. Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ dị n’Ụmụnnama Ebenatọ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ sitere n’ime obodo ahụ na mpụga ya. N’okwu ya n’oke mmemee ịwa ji ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Edwin Chinaewubeze Ezejiburu (Obi nke mbụ n’Ebenatọ), kọwara iri ji ọhụụ dịka otu n’ime mmemme pụrụ iche e jiri mara Igbo niile nakwa dịka ihe mbụ a na-eme n’obodo tupuu ndị obodo ahụ amalite iri ji ọhụụ n’ezinaụlọ ha dị iche iche. O toro Chineke onye mere ka ha dị ndụ wee gwuputa ji ha tinyere n’ala, ma kpekwazie ekpere maka ogologo ndụ, ahụ isi ike na ọganihu nke ụmụafọ obodo ahụ, ndị Igbo na ala Nigeria n’izùgbe. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na mmemme ahụ, otu nwa amadi na-esonyesi ike n’ihe a na-eme n’obodo ahụ ma bụrụkwa onye e chiri echichi dịka Ọnwa Ebenat