Posts

Showing posts with the label Dr. Onyekachi Ibezim

Osote Gọvanọ Anambra agwala ndị ụlọọọrụ ya ka ha tinye uchu n'ọrụ

NWA amadi ahụ e duru n’iyi ọrụ ọhụrụ dịka osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim akpọkuola ma dụọ ndị ọrụ nọ n’okpuru ụlọọrụ ya ọdụ ka ha dị uchu n’ọrụ ha, iji nye aka hụ na ọchịchị ahụ nọ ugbua na steeti ahụ rụzùpụ̀tàrà ebumnobi ya nye ndị Anambra.   Dọkịta Ibezim kwupụtara nke a oge ya na ndịisi ngalaba ụlọọrụ dị icheiche dị n’okpuru ụlọọrụ ya ahụ nwere ọgbakọ n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.   Ọ kọwara na ọchịchị ahụ nọ ugbua na steeti ahụ, nke Ọkammụta Chukwuma Soludo nọ n’isi ya, bụ ọchịchị bu ọdịmma ụmụ mmadụ n’obi, bụkwa nke batagoro n’ọkwa imemìlà ihe dị icheiche na-echere ụmụ mmadụ aka mgba n’ụdị ọbụla na steeti ahụ. N’ihi nke ahụ, ọ gwakwazịrị ha na a gaghị anabata ihe ọbụla bụ ịdà mbà n’ọrụ, maka na nke ahụ ga-abụ ịdọghachi aka elekere azụ n’imezupụta ezi ebumnobi ahụ ọchịchị ahụ jiri bata n’ọgbọ.   Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-abịa ọrụ n’oge ma na-arụsi ọrụ ike; ọbụladị dịka o kwèrè ha nkwà na a ga-enwe ezi mmekọrịta na ezi njikọaka n’etiti