Ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ ise maka ọnwụ nwaakwụkwọ Dowen Kọleeji
NdỊ uweojii kọmandị Lagos ekwuputala na ha anwụchikọọla ụmụakwụkwọ ise aka ha dị n’ọnwụ Sylvester Oromoni (Jnr) nke Dowen College, Lekki. Okwuputa okwu ndị uweojii kọmandị Lagos, CSP Adekunle Ajisebutu, onye kwuputara nke ahụ kwukwara sị na a malitela nnyocha banyere ọnọdụ ahụ dịka ọ kọwara na ụmụakwụkwọ ise ahụ na-enyere ha aka n’ime nnyocha. O kwere nkwa na ndị uweojii kọmandị ahụ ga-eme ihe niile ha kwesịrị ime iji chọpụta otu mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ. Ka ọ dị ugbu a, Kọmishọna uweojii steeti ahụ, Hakeen Odumosu enyela Divisional Police Officer, Maroko, ntụziaka ka ọ gaa n’ụlọakwụkwọ ahụ maka nnyocha. Dịka otu ọnọdụ ahụ si dị oke mkpa, ahafeela okwu n’aka ndị ọ dị n’aka, Homicide Section nke State Criminal Investigation Department, Panti, ozigbo. Otu o sila dị, otu jikọtara ndị nne na nna n’ụlọakwụkwọ ahụ, akpọọla oku maka ikpenkwụmọtọ n’ebe Oromoni nọ, tinyere ịgbanwe ọnọdụ ọchịchị n’ụlọakwụkwọ ahụ. Ndị nne na nna ahụ gara n’ihu kwuo ka a gbanwee ndị nkuzi na-ahụ maka ebe