Dino Melaye akwaala arịrị maka ọnọdụ ya
DỊKA a sị na ọ na-abụ mmadụ lechaa ndụ ya anya, o were aka ya nye onwe ya aha, otu nwa amadi ahụ a na-anụ aha ya anụ n’igwù n’okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ala Nigeria, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo mpaghara Ọdịda Kogi (Kogi,West) n’ụlọ ọgbakọ Sineeti ala anyị, bụ Maazị Dino Melaye ekwuola na ya dị nnọọ ka akpa amụ ebule (oke atụrụ), dịka o lechaara anya n’ihe megoro na ndụ ya nsó-nsó a. Maazị Melaye kwuputara nke a n’ozi ọ kụpụrụ ụbọchị Tuzdee site n’akara nzìkọrịta ozi ‘Instagram’ ya. N’ịkọwaru nke ahụ n’isi, o mere ka a mara na ihe e jiri mara akpa amụ èbùlè bụ na a yọgharịchaa ya elu yọgharịchaa ya àlà, ọ kwụrụkwa ebe ọ kwụ, na ọ gaghị ada ada ma ya fọdụzie ịkwụsị ịrụ ọrụ. N’iwète nke ahụ na ndụ ya, o kwuru na na-agbanyeghị ihe ọ sọrọ sị yọgharịba ma ọ bụ chịgharịba ya, e mechaa ihe niile ahụ, na ya ka ga-akwụrụkwa ebe ọ kwụ, dịka akpa amụ ebule, maka na Chineke kàrịrị ndị na-ayọgharị ya. Anyị ga-echèta na ya bụ nwa amadi bụ onye ndị uwe ojii nwụchikọrọ ma jụkwa ịha