Posts

Showing posts with the label Delta

Na Delta, ndị uweojii azọpụtala agadi nwaanyị n’aka ndị ntọ

NDỊ ọrụ uweojii na steeti Delta steeti anapụtala otu nwanyị dị afọ iri isii na atọ ndị ntọ tọọrọ ma jidekwa otu onye n’ime ndị ntọ ahụ tọọrọ ya, bụ Davidson Odigho.    Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Bright Edafe kwupụtara nke a ụbọchị ụka, ma mekwa ka a mara na onye a na-enyo enyo bụ Davidson Odigho, bụ onye a nwụchiri ka ya na ndị otu ya na-achọkwa ịtọ̀rọ̀ otu nwoke si mba Europe wee lọta na nsonso a.    Ọ sị na ọ bụ n’abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba ka ha nwetara ozi site n’aka onye ọgbaatùmtùm banyere ụmụnwoke abụọ jigasị mma we nwụchie ma jide otu nwaanyị bụ onye obodo Ughelli na mpaghara okporoụzọ ebe dara òwù dị n’akụkụ obodo Irri-Aviara, ma bụrụkwa ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ka ha nwetachara ozi ahụ, onye ji ọkwa DPO mpaghara Oleh, bụ SP Paul Oboware kpọkọtara ndị ọrụ ya ngwangwa, wee duru ha na ndị nche obodo Irri, wee gbochie ma gbaa ọhịa dị ebe ahụ gburugburu. Ngwangwa ndị ntọ ahụ hụrụ ha, ha gbahapụrụ on

Na Delta, ndị oji egbe egbuola pastọ RCCG

NDỊ oji egbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola otu pastọ nke ụlọụka Redeemed Christian Church of God (RCCG), Silvester Yerinbide. Ya bụ ọdachi dapụtara n’okirikiri Aladja dị n’okpuru ọchịchị Udu na steeti Delta.   Ka anyị cheta na onye hibere RCCG bụ pastọ Enoch Adeboye.   Dịka e siri kwu, pastọ ahụ lara mmụọ si n’agbataobi ahụ, Ogbe-Ijoh nke dị n’okpuru ọchịchị Warri Southwest, na steeti ahụ.   Yerinbide ka e kwuru na a wakporo ya ebe ọ na-aga ekpere abalị (vigil) na Nadja. Dịka nke ahụ mechara, ndị ji ọgbatumtum bụgara ya otu ụlọọgwụ dị n’ogbe ahụ, ma e mechara nwụọ n’ihi mmerụ ahụ o nwetara na nwakpo ahụ.   Ndị Ijaw Youth Council (IYC) n’Ogbe-Ijoh na-akọwa na ndị gburu onyisi ụka ahụ si Aladja dịka Yerinbide kọwara site n’ákwá ọnwụ ya na ndị ahụ wakporo ya na-asụ asụsụ Urhobo.   N’akụkụ nke ya, onyisi Aladja, Otto Ogbiruveta gọrọ agụgọ na ndị gburu pastọ ahụ esighị n’ogbe ya ma kwukwaa na a na-amazi imi n’ala iji chọpụta otu mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ.   Ogbe abụọ ahụ sere okwu n’oge gar

Na Delta, ndị uweojii ejidela ndị otu nzuzo ebe ha na-anabata ndị ọhụrụ

NDỊ uweojii steeti Delta anwụchikọọla ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo na ndị omekoome n’ebe nzuzo ha dị n’ime ọhịa, oge ha na-anabata ndị ọhụrụ n’otu nzuzo ha.   Ndị ahụ e jidere ruru mmadụ iri n’ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n’ime anyasị n’obodo Onicha-Ugbo dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Aniocha North’ nke steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na ha bụcha ndị otu nzuzo Aiye, ndị e jiri ‘Black Axe’ wee mara.  Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Delta, bụ DSP Bright Edafe bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na steeti ahụ, n’aha onyeisi ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ CP Ari Mohammed Ali.   O mere ka a mara na e nwetere ótù nsụnsụ egbe n’aka ndị ahụ, tinyere ọtụtụ mgbọ egbe dị icheiche site n’aka mmadụ abụọ n’ime ndị otu nzuzo ahụ. O kwukwara na e nwetara anwụrụ ike, otu ụgbọala ‘Honda Accord’ (nwere akàrà Lagos KSF 586 DU), ọgbatumtum ise na otu àkpa osikapa ákwà juru n’ime ya n’ebe ahụ ndị otu nzuzo ahụ nọ eme y

N'Delta, ndị uweojii ejidela okorobịa ise maka izuru okporoigwe ugbọoloko si aga

NDỊ uweojii anwụchikọọla ụmụnwoke ise maka imebi ma zuru okporoụzọ ugbọoloko (rail track), nke ụlọọrụ na-ahụ maka njem ugbọoloko, Nigeria Railway Corporation dezichara ohụrụ, ma buru nke di n’uzọ Warra-Itakpe. Ndị uweojii kwuru na ndị omekome ahụ bepụtara ọtụtụ nkeji (sections) nke okporoigwe ugbọoloko ahu, ihe dịka kilometa iri atọ, na mpaghara Adogo (steeti Kogi), nke okporoụzọ ụgbọoloko ahu.   Otu ọ sila dị, ndịisi NRC chọputara ya bu mbibi ma mee mkpesa, dika o kwesịrị.   Ka anyi cheta na amụma ọrụ okporoụzo ugbọoloku ahu bụ nke gọọmenti etiti hibere n’onwa Septemba 2020. Okporoụzọ ụgbọoloko Itakpe-Warri ahụ jikọtara Warri nke di na steeti Delta na Ajaokuta dị na steeti Kogi.  E wepusikwara ụfọdụ ihe e ji hiochisi okporoigwe ahu dika ‘bolts’ na ‘knots’ nke ziputara njikere ha di, iburu okporoigwe ahụ gbalaga.   Onyeisi ụlọọru Nigeria Railway Corporation (NRC), bu Fidet Okhiria gwara ndị ntaakụkọ na ya bu ihe mere eme n’ezie. Okwuru na o mere na kilometa iri atọ, Adogo, mpaghara ste

Na Delta, ndị uweojii ejidela pastọ, nwunye ya, onye ọzọ maka ịtụ mgbere mmadụ

NDỊ uweojii Ughelli ‘A’ Division anwụchikọọla otu pastọ, nwunye ya na otu onye ọzọ maka ịtụ mgbere mmadụ n’Oviri-Ogor nke dị n’okpuru ọchịchị Ughelli North na steeti Delta.   A chọpụtara na ndị ahụ a na-enyo enyo adịla na mbụ kpofee otu nwata nwaanyị gbara afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Oghenfejiro Obotakpore n’aka otu nwaanyị a matabeghị onye ọ bụ na steeti Bayelsa, tupu ha kpọgazie ya Libya, otu obodo dị n’Africa.   Ya bụ nwoke, Maazị Sunday Adeyemi bụ osote pastọ n’otu ụlọụka ndị uwe ọcha (white garment church) nke akpọghị aha. A nwụchịkọrọ ha mgbe ahụ n’ihi ozi (text message) nke sitere n’aka nwaanyị ahụ ha gbogara Libya, nke ọ nọrọ kọwaara otu onye ikwunaibe ya gbasara ọnọdụ ọjọọ ọ hụtara onwe ya na mba ahụ.   Ya mere, a gwara ndịisi obodo ahụ banyere ya nke mere ka a gaa kpesara ndịuweojii Ughelli ‘A’ Division. Ha nwụchikọrọ nwunye pastọ ahụ onye nke di ya hibere ụka ọcha ọzọ n’Evwreni, ma bụrụ osote pastọ n’Oviri-Ogor na nwaanyị ọzọ onye kpara nkata ahụ, na steeti Bayelsa.   Otu

Oke mmiri ozuzo achụpụla ihe karịrị otu puku mmadụ n'ụlọ na Delta

NNUKWU mmiri nke zoro ụbọchị ụka gara aga achụpụla ihe karịrị otu puku mmadụ n’ụlọ n’Oghara nke dị n’okpuru ọchịchị Ethiope ‘West’ na steeti Delta. Ndị nile bi na mpaghara ahụ nọzi na nsogbu n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-eme. Ha bidoro kwawa ngwongwo ha na mmiri ahụ n’ike n’ike. Maazị Abel Imonina gwara ndị nta akụkọ n’onweghị ebe ya na ụmụ ya asaa ga-alarụ ma kwakwaaa arịrị na o tufuru ngwongwo ruru nde naịra n’ide mmiri ahụ nke tokporo ụlọ ha ma mezie ka ha gbara aka. Otu onye ọkwọ ụgbọala onwe ya ekweghị njide ji ibe akwa wee gwa ndị nta akụkọ na ya bitere ego ebite wee gote ụgbọala iji wee na-enye ezinaụlọ ya ihe oriri ma ugbu a ide mmiri etokpola ụgbọala ahụ.