Na Delta, ndị uweojii azọpụtala agadi nwaanyị n’aka ndị ntọ
NDỊ ọrụ uweojii na steeti Delta steeti anapụtala otu nwanyị dị afọ iri isii na atọ ndị ntọ tọọrọ ma jidekwa otu onye n’ime ndị ntọ ahụ tọọrọ ya, bụ Davidson Odigho. Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Bright Edafe kwupụtara nke a ụbọchị ụka, ma mekwa ka a mara na onye a na-enyo enyo bụ Davidson Odigho, bụ onye a nwụchiri ka ya na ndị otu ya na-achọkwa ịtọ̀rọ̀ otu nwoke si mba Europe wee lọta na nsonso a. Ọ sị na ọ bụ n’abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba ka ha nwetara ozi site n’aka onye ọgbaatùmtùm banyere ụmụnwoke abụọ jigasị mma we nwụchie ma jide otu nwaanyị bụ onye obodo Ughelli na mpaghara okporoụzọ ebe dara òwù dị n’akụkụ obodo Irri-Aviara, ma bụrụkwa ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọ. Ọ gara n’ihu kọwaa na ka ha nwetachara ozi ahụ, onye ji ọkwa DPO mpaghara Oleh, bụ SP Paul Oboware kpọkọtara ndị ọrụ ya ngwangwa, wee duru ha na ndị nche obodo Irri, wee gbochie ma gbaa ọhịa dị ebe ahụ gburugburu. Ngwangwa ndị ntọ ahụ hụrụ ha, ha gbahapụrụ on