E liela ozu Deborah ụmụakwụkwọ Sokoto e tigburu na steeti Niger
ANYAMMIRI zoro ka mmiri na nsonso a ka a dọnyere ozu Deborah Yakubu n’ala, n’obodo ya dị na steeti Niger. Ọ bụ nnọọ oge nnukwu ihe mgbu dịka nne na nna, ikwunaibe tinyere ndị o metụtara n’obi bere akwa akwụsị akwụsị mgbe a dọnyere ozu ya n’ime ala, na Tunga Magajiya dị n’okpuru ọchịchị Rijau nke steeti Niger. E kwuru na nne ya koropuru na Tọzdee izuụka gara aga, mgbe ọ nụrụ banyere ọnwụ ntụmadị nwa ya nwaanyị, ma nke bụ nsogbu dapụtara n’obodo ahụ mgbe e bulatara ozu ya na Satọdee. E nwere obere nghọtahie tupu e lie ozu ya n’ihi na ndị ntorobịa obodo ahụ kwuru na elimozu ya kwesịrị ịbụ oke na ọrụ dịịrị gọọmenti steeti Sokoto, ebe ezinaụlọ kwuru na a ga-eli nwa ha nwaanyị n’enweghị njikọaka gọọmenti. Ka nke ahụ gachara, e liziri ozu Deborah ka o ji ihe dịka ọkara gafee elekere isii nke mgbede, n’ebe elimozu ndị otu Kraịst (Christian Cemetry), dị na Tunga Magajiya. Onye nọ n’isi ekpere tupu a dọnye ozu ya n’ala bụ nwanne nna ya, Emmanuel Maaji, bụ Pastọ n’ulọụka ECWA dị na Tunga