Posts

Showing posts with the label Dayọsiisi Aguata

Ndị Anglikan n’Aguata emeela nnukwu ọgbakọ ndị nna, katọọ ajọ ọnọdụ Nigeria nọ ugbua

BISHỌỌPỤ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Agụata, bụ Rt. Rev. Samuel Ezeofor akatọọla ma gbarụọ ihu banyere ajọ ọdachi na ihe iche aka mgba dị icheiche na-adakwàsị ala Nigeria, ya na ihe isiike ndị ọzọ ụmụafọ Nigeria na-agabiga ugbua.   Bishọọpụ Ezeofor kwupụtara nkatọ a n’ozi ya ọ gụpụtara na mmemme nnukwu ọgbakọ ndị nna na dayọsiisi ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St. Augustine’s Anglican Church, Umunze, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Orumba South’ nke steeti Anambra.   Dịka ọ na-akpọkù ndị ji ọkwa ọchịchị ka ha gbasie mbọ ike iji weta ajọ ọnọdụ ahụ na njedobe; ọ kpọkwara òkù ka a na-enwe ikpe nkwụmọtọ na ihe ịga n’anya ya, ma na-agbasòkwa usoro nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, ma nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ, ọkachasị dịka o siri metụta n’ikesà akụnụba, na inye maọbụ ịkpọlite n’ọkwa, ma n’ogoogo gọọmenti etiti ma na nke steeti.   Mgbe ọ na-akpọ òkù ka onye ọbụla jisie ike n’ekpere ma chọọ ihu Chineke ka o wee gbata ọsọ enyemaka n’ajọ ọnọdụ ahụ; ya bụ Bishọọpụ, onye ozi ya gbàdoro ụkwụ n’isio

Na Dayọsiisi Aguata, Bishọọpụ Ezeofor agbapeela isi ụlọọrụ na ụlọakụ ọhụrụ

OKE ọñụ dara na nsonso a na Dayọsiisi ụka Angịlịkan Agụata dị na steeti Anambra, dịka Bishọọpụ Samuel Ezeofor gbapere agadaga ọmarịcha isi ụlọọrụ dayọsiisi ahụ a rụrụ ọhụrụ, nakwa ụlọakụ dayọsiisi ahụ, a maara dịka ‘Gosife Microfinance Bank’.   Mmemme ịgbape nnukwu ụlọ abụọ ahụ na iche ha n’ihu Chineke bụ nke e jiri ofufe nrò pụrụ iche wee malite, ma bụrkwa nke dọtara ọtụtụ ndị bishọọpụ dayọsiisi dị iche iche, ndịisi ụka, ndị ọrụ gọọmentị, ụmụafọ dayọsiisi Agụata, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ siri ebe dị iche iche wee bịa.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Bishọọpụ Ezeofor (onye e guzobere dịka Bishọọpụ Dayọsiisi ahụ n’ahọ 2018 oge ‘Most Reverend’ Christian Efobi nọbụ ebe ahụ lachara ezumike nka) mèrè ka a mara na ọ bụ ụlọ ezumeezu dị n’ụlọụka Katidraal nke St. John Ekwulọbịa ka ndị ọrụ dayọsiisi ahụ jibụ wee mere ebe ha ga-anọgodi wee na-arụ ọrụ, kemgbe ahọ 2005 e jiri kewàpụta ya bụ dayọsiisi, bụzị nke mere o jiri dị nnukwu mkpa ịrụ ya bụ usi ụlọọrụ.   O kwuru na isi ụlọọrụ ọhụrụ ahụ a rụrụ ugbua, (nke