N'ihi ekwentị, ezinaụlọ mmadụ asatọ anwụọla n'ọkụ ọgbụgba gaasị
NNUKWU ọdachị dapụtara na Steeti Kastina n’ihi ọkụ ọgbụgba gaasị. Nke ahụ mere n’obodo Dan-Musa dị na steeti ahụ, ebe ezinaụlọ mmadụ asatọ kpochapụrụ n’otu ntabi anya, tinyere ngwongwo gburu nde kwuru nde naịra. Nnyocha e mere gosịrị na otu onye n’ime ndị ahụ nwụrụ anwụ nọ na-akpọ oku ekwentị n’usekwu (kitchen) dịka ha ji gaasị na-esi nni, nke mere ka ụlọ ahụ nwuru ọkụ. Otu onye ọ nọ ka o mere aha ya bụ Nura Sani gwara ndị nta akụkọ na ụmụnwaanyị atọ na ụmụaka ise nwụrụ na ya bụ ọdachị n’ihi na mbọ niile ndị agabyaobi gbara iji gbawaa ọnụ ụzọ ụlọ ahụ zọpụta ha enweghị isi. Otu n’ime ụmụnwaanyị lara mmụọ aha ya bụ Maryam Shuaibu ka e kwuru na o si Abuja wee bịa maka agbamakwụkwọ nke ọ chọrọ ịga n’ebe ahụ. Ọ nọ na nke ndị enyi ya wee si otu ahụ zute ọnwụ ya. Otu o sila dị, e liela ozu ha dịka usoro ekpemekpe ụka Alakuba (Islam) siri dị. Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti ahụ (The State Police Public Relations Officer) bụ SP Gambo Isah kwupụtara na ya bụ ọkụ ọgbụg