Posts

Showing posts with the label Cross River

Otoro agbagbuola mmadụ iri abụọ na Cross River

IHE karịrị mmadụ iri abụọ anwụọla n’ihi ọrịa otoro (cholera) nke dapụtara n’Ekureku dị n’okpuru ọchịchị Abi, na steeti Cross River.   Ekureku nke ogbe iri na abụọ mejupụtara dị n’agbata steeti Ebonyi, ma bụrụ ndị e ji ọrụugbo mara.   A chọpụtara na Ekureku nwere ihe iche aka mgba, ezi mmiri ọǹụǹụ tinyere enweghị ezi ihe nlekọta ahụike na nsonso a.   Ndị bi nso n’obodo ahụ gwara ndị ntaakụkọ na a chọpụtara ọrịa otoro ahụ oge ọtụtụ ndị obodo ahụ malitere nyụba ọnyụnyụ ọnyụnyụ na ọgbụgbọ dị egwu.    E kwuru na mbụ, e chee na ọ bụ ọrịa nke ha na-ahụtakari n’oge ọkọchị, ma mechaa chọpụta na nke a na-agbasa n’ike n’ike ma na-egbu ndị ọrịa ahụ dakwasara nkeje olemole ha malitere nwụba nsị mmiri mmiri.   Otu n’ime ndị okenye e nwere n’obodo ahụ, gwara ndị ntaakụkọ na ọrịa ọjọọ ahụ egbuọla mmadụ karịrị iri abụọ n’ọnụọgụ.   O kwuru na ha agbaala mbọ ime ka ndị ọ dị n’aka gbata osọ enyemaka. Ndị gụnyere ụmụ ha na-arụgasi ọrụ na ngalaba ahụike, ka ha lọta ụlọ leruo anya, mara ihe ha ga-eme iji kwụ

Na Cross River, otu nwoke agbagbuola nwunye ya, kwụọ ụdọ

OTU nwoke aha ya bụ Akpan agbagbuola nwunye ya ma kwụọ ụdọna steeti Cross River. E kwuru na ọ kpara arụ ahụ n’ihi na ọ na-ebo nwunye yaebubo na ọ na-agba n’iro.   Mkpamkpa ahụ kparana Bashua nke dị n’okpuru ọchịchị Boki na steeti ahụ ebe nwoke ahụ na nwunye yandị nke bụ ndị steeti Awka Ibom bi wee na-arụ ọrụugbo.   Otu onye bi n’ogbeahụ aha ya bụ Elias Ejue gwara ndị ntaakụkọ na di na nwunye ahụ nwere nghọtahien’ihi na nke nwoke na-ebo nwunye ya ebubo ịgba n’iro nke butere iwe, nwoke ahụbara wepụta egbe ya, gbaa nwunye ya ọ nwụọ ozugbo ebe ahụ.   Ọ gara n’ihu kwuo sị:“Dịka o gbuchara nwunye ya, nwoke ahụ gbabara n’ime ọhịa, anyị wee chịkọba ndịmmadụ wee chọba ya kemgbe Satọdee. Ọ bụ na Monde ka anyị hụrụ ozu ya ka o koron’elu otu osisi dị n’ime ọhịa.”   Ọ kọwara na nwoke ahụna nwunye ya ebiela ọtụtụ afọ n’obodo ahụ, na ha mụtara ụmụnwoke ise tupu ọdachiahụ adapụta. Ọ rụtụkwara aka na ọ bụ arụ (nsọala) mmadụ igbu mmadụ ibe ya maọbụgbuo onwe ya, n’obodo ahụ.   Ọ gakwara n’ihu kwuosị: “Ot