E liela ozu Oriakụ Comfort Okonkwo n'Ihite Orumba
Dịka a sị na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya, ọ laa, e liela ozu Oriakụ Comfort Madụbom Okonkwọ n’ezinaụlọ be di ya dị n’ime ogbè Ụmụọkparukwu dị n’obodo Ihite n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra. Mmemme akwamozu ahụ bụ nke a màlitere site n’ụka onye nwụrụ anwụ a kaara ya bụ agụ nwaanyị n’ụlọ ụka ‘St James Anglican Church, Ihite’ ma bụrụkwa nke bishọọpụ ụka Anglikan na dịyọsiisi Agụata, bụ, Bishọọpụ Samuel Ezeọfọr nọ n’isi ya. N’okwuchukwu ya n’ofufe nro ahụ, Bishọọpụ Ezeọfọr kọwara ọnwụ dịka ụgwọ onye ọbụla dị ndụ ji n’ụwa ma bụrụkwa nke a na-akwụ naanị otu ugboro, nke, mgbe ọ gasịrị, ikpe esochie ya azụ. O mere ka a mara na n’ụbọchị ikpeazụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ bànyere otu o siri bie ndụ ya, ma kpọkuzie, dụọ onye ọbụla ka ọ hazie ndụ ya ma kwadoo onwe ya nke ọma, n’ihi na o nweghị onye ma ahọ, ụbọchị ma ọ bụ oge òkù ọnwụ nke ya ga-akpọ ya, e wee chịkọta ije ozi ya ma nyekwa ya ụgwọ ọrụ ruuru ya site n’aka onye kere ụwa. Mmemme akwamozu ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị s